ỤLỌIKPE ‘Idi-Ogungun Customary Court, Agodi’ nke dị n’Ibadan ekewaala alumdi dị n’etiti otu onyeisi ụka na nwunye ya n’ihi mkpesa nke onyeisi ụka ahụ nyere banyere otu nwunye ya esighị ekwezi ka ha nwee mmekọ dịka di na nwunye n’ihi na amụ ya pere mpe.
Onyeisi ụka ahụ bụ Pastọ Samson Farounbi, rịọrọ ụlọikpe ahụ ka ha kewaa ha ma mechie alumdi afọ iri na iteghete nke ya na nwunye ya bụ Tope Farounbi n’ihi enweghị ezumike mkpuruobi, imaaka (threat) na ndụ ya, tinyere enweghị nsọpụrụ n’ebe ezinaụlọ ya nọ.
Farounbi kọwara na nwunye ya bụ onye na-azụ ahịa mkpụrụ osisi anaghị alọta ahịa n’oge ụbọchị ọbụla ma jụ na ha agaghị na-enwezi mmekọ dịka di na nwunye. O kwuru sị: “oge m jụrụ ya ihe mere ojighị alọta n’oge ma jụkwa ka anyị na-enwe mmekọ, ọ zara m sị na ọ bụ n’ihi na amụ m pere mpe ka ya ji eme otu ahụ.”
Ọ gara n’ihu kwuo na nwunye ya kwuru ka ya ñụọ ọgwụ mgborogwụ iji wee mee ka ya bụ ihe o ji bụrụ nwoke bulite ibu. N’ikpeazụ, na ya ñụrụ ọgwụ ‘Agbo’ mana nke ahụ emeghị ka nwunye ya chegharịa.
Onyeisi ụka ahụ gara n’ihu gwa ụlọikpe ahụ na nwunye ya enweghị nsopụrụ n’ebe nne ya na ụmụnne ya nọ, tinyekwara na ọ na-alụso ụmụnwaanyị na-abịa ụka ya ọgụ ma na ebo ya ebubo na ya na ha na-enwe mmekọ. O kwukwara sị na ụmụ ise ha mmụtara enweghị nsọpụrụ n’ebe ya bụ nna ha nọ.
N’akụkọ nke ya, nwunye ya bụ Tope gọrọ agụgọ n’ebubo ahụ niile ma rịọ ụlọikpe ahụ ka e kewaa alumdi ha dịka di ya si chọọ.
O bokwara di ya ebubo na ọ na-eso ụmụnwaanyị ma kwukwaa na ọ naghị achọ ọdị mma ya, tinyekwara na ọ na-añụ mmanya na-aba n’anya.
Onyeisioche ụlọikpe ahụ, Maazị Mukaila Balogun na ndị na-eso ya ekpe ikpe kewara alụmdi ahụ ma nye iwu na nke nwoke ga-akpọrọ ụmụ ha nwoke atọ, ebe nwunye ya ga-akpọrọ ndị nwaanyị abụọ.
Ọ gwakwara nwoke ahụ na ọ ga na-akwụ nwunye ya puku naira asatọ ọnwa ọbụla maka ilekọta ụmụaka ụmụnwaanyị abụọ ahụ anya, ma dọọ ha aka na ntị ka ha gbaara nsogbu ọsọ ma hapụ ịbụ ọgbata uhie n’ebe udo ndị mmadụ dị.