N’EZIOKWU ọ na abụ ihe mwute mgbe nwaanyị lụrụ di, ọ dịka aga-asi na-atufuru ya atufu ma ọ bụ ree ye ere. Na mpaghara ala Igbo, o nwere otu esi emeso ụmụnwaanyị lụrụ di nke imirikiti ụmụnwaanyị ugbua na-enwezi nkolopu obi na-alum di n’ihi ọnọdụ nwaanyị n’ezinaụlọ ebe ọ lụrụ di. Ọ na-abụ nwaanyị lụọ di, anapụ ya ikike nile o nwere n’ụwa na be nna ya, na-amaghị na ọ bụghị alum di nile na-eguzo.
Ụmụnwaanyị siri ike ime mụọ na ike anụ ahụ site na ịkara obi hapụ nne, nna, ụmụnne, ezinaụlọ na obodo ha gaa biri be nwoke; hapụ aha nna ya zaba aha nke nwoke; baa n’ezinaụlọ o nweghị onye ọ ma ga biri, mujuoro ha ụmụ ụlọ. Hee! ụmụnwaanyị siri ike! Añụrị na-adị n’ezinaụlọ ọ batara ma mwute na-adị n’ezinaụlọ o si wee pụ. Ọtụtụ na-ebe akwa ma o nweghị ihe a ga-eme ya n’ihi na ọ bụ ka Chi siri debe ya.
Ọtụtụ uru dị iche iche dị na-alum di na nwunye ma otu omenala Igbo siri debe ọnọdụ nwaanyị mere ka ọtụtụ ụmụnwaanyị na-agba ọsọ ma ọ bụ na-eme ka ha ghara inwe mmasi ịlụ di n’ihi agwa a na-akpaso ha ma ọ bụ ọnọdụ e debere ha ebe ahụ. Nke ka njọ bụ na ịhụ ihe nwoke lụrụ nwaanyị na-eme nwunye ya nke na onye ọzọ nọ n’ezinaụlọ ahụ na-abịazi agbara ya ọgụ na-azọpụta ya n’aka nwoke na-alụ ya. ọ dị egwu!
Nke kasi njọ abụghị ọnụ elu eji ekpuchi ọnụ ala bụ na nwaanyị na-ahuju anya na be di ya, bere akwa laa be nna ya ka ọ gwa ha ihe nile ana-eme ya. Ezinaụlọ o sịrị na ya pụta e were ọsọ chụọ ya, sị ya laa bee di ya na site n’ụbọchị ahụ ọ lụrụ di na o nweghịzị oke o ketara n’ezinaụlọ a. Nke a bụ elu eru aka, ala eru aka, ụwa ụmụnwaanyị! Ọtụtụ ụmụnwaanyị ewepụla obi kpam kpam na-alum di n’ihi ọnọdụ ọjọọ ha hụrụ ụmụnwaanyị ibe ha na-agabiga na ya.