OTU oge gara aga mgbe amụbeghị ndị nna anyị ha,ọ dị otu nzukọ jikọtara ụmụanụmanụ niile. Ụmụanụmanụ na-agbakọ na-atụ elo ma na-ekwukwa maka nsogbu dịirị ha na otu a ga-esi dozie ya.
Ihe kacha ha mkpa na ya bụ nzukọ bụ otu ha ga-esi dozi nchekwa ha na ime onwe ha ka ha baa ọgaranya. Ha chọrọ ibi n’obi aǹụrị n’obodo ha. N’ime nzukọ ha, ha nwere ndị isi: Agụ bụ onye isi oche, Enwe bụ ode akwụkwọ, Ewu bụ ode akwụkwọ ego na ndị isi ndị ọzọ ma ha e nweghị ojide ego. Ha bidoro nwebe mgbakasi ahụ n’onye ga-abụ ojide ego, ha wee nwee nzukọ ịhọpụta onye ga-abụ ojide ego ha.
N’ikpeazụ, ha họpụtara nnekwu (nwunye ọkụkọ) na ọ bụ ya ga-abụ ojide ego ha. Ụmụanụmanụ nwere aǹụrị nke ukwuu n’ihi na ha hụrụ na ọ ga- ejidenwu ego ha n’ihi obi umeala ya na ikwesi ntukwasi obi ya.
Ụmụanụmanụ wee bido tụkọtaba ego ka ume onye ọbụla ha. Ihe bụ ebum n’obi ha na ya bụ ego ha na-atụkọ bụ ịba onwe ha ọgaranya. A na-enye nnekwu ego niile ha tụkọtara n’nzukọ dịka ojide ego.
Mgbe nnekwu laruru n’ụlọ ya, o gwuru ala tinye ego ahụ. Ọ gwara di ya okeọkpa na ụmụ ya ụmụuriom maka ego ahụ ma dọkwaa ha aka na ntị ka ha ghara ịnabata onye ọbịa ọ bụla n’ụlọ ha ka ọ ghara ịma ebe ego ahụ dị. Ego ahụ mere ka nnekwu na ezinaụlọ ya na-akpachapụ anya na mmekọ ha na ụmụanụmanụ ndị ọzọ. Ka ọ dị izuụka ọzọ!