GỌỌMENTI Anambra enyela ndi ntorobịa sitere mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ ọzụzụ maka otu e si ede, agbakwụnye ma na-atụgharị okwu n’asụsụ Igbo na wikipedia.
Ọzụzụ mkpụrụ ụbọchị abụọ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’Awka, n’isi ngwụcha izuụka gara aga, ma bụrụkwa nke a chịkọbara site n’aka ụlọ ọrụ nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ n’ihe gbasaara usòrò ọrụ aka dijitaalụ, na njikọ aka ụlọ ọrụ na-ahụ maka nkwàlite ndị ntorobịa na nkewapụta akụnụba ihe e ji aka emeputa, tinyere ụlọ ọrụ Wikipedia.
N’okwu ọ gwara Ka Ọ Dị Taa bànyere ya bụ ọzụzụ, onye chịkọbara ya bụ ọgbakọ, ma bụrụkwa nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ n’ihe gbasaara usòrò ọrụ aka dijitaalụ, bụ Maazị Ifeanyị Anịagọh mere ka a mara na ebumnobi e jiri hazie ya bụ iji mee ka ndị ntorobịa steeti ahụ soro bụrụ ndị ma nke ekwe na-akụ n’ihe gbasaara iji usoro dijitaalụ mee ihe n’asụsụ Igbo, ọbụnadị dịka ka o siri metụta idebanye, ịtụgharị na itinye okwu na ederede ndị ọzọ na Wikipedia, bụ ebe ndị mmadụ n’ụwa gbaa gburugburu ga-enwe ike ịhụ ma ọ bụ gụọ ya n’ụsoro ọnyanwududo ịntaneeti.
Ọ kọwara aka na-achị steeti ahụ, bụ gọvanọ Willie Obianọ dịka nwoke nwere ezi mmasị n’ịkwàlite ndị ntorobịa n’ụzọ na ime ka ha bụrụ ndị bara urù, bụzị nke mere ọchịchị ya ji abàgide n’ikewàpụtara ha ọtụtụ atụmatụ na ohere ọma dị iche iche, ma kwukwazie na ya bụ ọzụzụ ga-enye ndị ahụ sonyere na ya òhèrè idere Wikipedia edemede na irita èrèrè n’amụma dị iche iche ụlọ ọrụ ji n’aka, nye aka n’ikewàpụtara ha ohere ọrụ, ma nyekwara ndị ahụ aka ịkuziri ndị ọzọ, ọbụnadị dịka ọ kpọkùrù ha ka ha jigidesie ihe ha mụtara ike.
Na nkọwa nke ya, onye nyere ya bụ nkuzi ma bụrụkwa onye sitere ụlọ ọrụ Wikipedia, bụ nwaada Tochi Precious mere ka a mara na ya bụ ọzụzụ, bụ agba nke abụọ ya a na-achịkọba na steeti ahụ, gbakwàsàrà ụkwụ n’inwetekwu ndị ga na-enye aka n’ịtụgharị ederede dị iche-iche e jiri bekee dee na Wikipedia ka ha dịkwa n’asụsụ Igbo, tinyere ndị ọhụụ a ga-edebàtakwa edebàta n’otu asụsụ Igbo ahụ.
Ya bụ nwaada sitere steeti Abịa kwuru na mmasị ya isonye na nke ahụ dàbèrè n’ọnụnụ ọkụ n’obi o nwere n’ihe gbasaara ịkwalite asụsụ Igbo, dịka onye ọkà asụsụ ọ bụ, n’ihi aka pụrụ iche nke ahụ ga-enye n’ichekwaba asụsụ na njiri mara Igbo; ma nyekwazie ndị sonyere na nkuzi ahụ ndụmọdụ ka ha were ihe ahụ ha mụtara na ya bàárá onwe ha urù, ma burukwa ya bụ oziọma bàá n’ime obodo.
N’ajụjụ ọnụ Ka Ọ Dị Taa gbàrà ya, onye n’ime ndị sonyere na ya bụ nkuzi, ma bụrụkwa onye e ji okwu ya agba izù n’otu ndọrọndọrọ All Progressive Grand Alliance (APGA), bụ maazị Ike Nibo kọwara atụmatụ ahụ dịka nke magburu onwe ya, n’ihi ọtụtụ uru dị iche iche nke ahụ ga-ewetara ndị sonyere na ya na aka ọ ga-enye ịhụ na asụsụ Igbo anwụnyụghị anya.
O fọrọ ekele n’ụkpa ma bunye aka na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ, ya na ụlọ ọrụ dị iche iche jikọrọ aka ọnụ ime ka nke ahụ pụta ìhè, ma rịọkwazie ka a e jigidesie ya bụ ọzụzụ ike ịhụ na a na-emezị ya kwa mgbe kwa mgbe malite ugbu a, ebe o kwukwàrà na ya ga-eji ihe ọ mụtàrà n’ebe ahụ wee meputa ihe.