E liela Oriakụ Okwuedo

0
495

E LIELA Oriakụ Chizoba Rosemary Okwuedo (nee Ezeoke)  ‘Diesel’ ebe ụwa niile bịara kelee Chineke maka ndụ ya.Ihe niile gara nkeọma, ma be di ya ma be nna ya.

Akwamozu ya ji ụka nche abalị (vigil mass) wee malite n’ezinaụlọ be nna ya bụ Pius Ezeoke n’Umugama Umuchu nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra na Tọọzdee ọnwa Junu dị n’abalị iri na atọ.

Ndị ụkọchukwu si ebe dị iche iche bịa, ha gụnyere bishọp abụọ, Bishọp Jonas Benson Okoye bụ osote bishọp dayọsis Awka na Bishọp Peter Eberechukwu Okpareke bụbu bishọp Dayọsis Ahiara na ndị ụkọchukwu dị ihe dịka iri ise.

A kara ụka elimozu na be di ya na St Anthony’s Catholic Church Ifite-Ogwari nke dị n’okpuru ọchịchị Ayamelum na steeti Anambra na Fraidee ọnwa Junu dị n’abalị iri na anọ.

N’okwuchukwu, Fada Benjamin Ewelu, onyeisi ụlọakwụkwọ ‘Pope John Paul II Seminary Okpuno’ chetaara ndị ụka maka nkewa nke ga-adị n’ụbọchị ikpeazu n’etiti atụrụ na ewu.

Ọ kọwara na ihunanya bụ isi na njem eluigwe. Ọ dọrọ aka na ntị ma kọwaa mkpa ọ dị mmadụ inyere mmadụ ibe ya aka.

Ka a gbasara ụka, e duuru ozu Oriakụ Okwuedo nke ndị bandị ‘Catholic Women Organisation’ (CWO) nke parishi ahụ nọ n’isi ya wee laba na be di ya, ezinaụlọ Okwuedo ebe nwanne ya nwoke bụ Fada Anthony Ezeoke nọ donye ya n’ala ebe ndị mmdụ na-ekele Chineke maka ndụ ya.

Fada Ezeoke kọwara nwanne ya nwaanyị lara mmụọ dịka onye na-agba mbọ ma bụrụkwa onye gosipụtara ụbụrụ ịnụ ọkụ site na nwata. O rịọrọ Chineke ka ọ nabata ya n’alaeze ya.

N’akụkụ nke ya, ada ya nwaanyị bụ Chioma Okwuedo kọwara nne ya dịka nwaanyị nwere obi umeala, ma bụrụkwa onye hụrụ onye ọbụla n’anya.

N’echi ya ka e lisiri ya, otu a kpọrọ Ada-Ụka nke Umugama Umuchu kwara ya n’ụzọ pụrụ iche, ebe ha nọkwa kọwaa ya dịka onye nwere obioma ma hụkwa ọha na eze n’anya.

A muru Oriakụ Chizoba Rosemary Okwuedo n’ezinaụlọ Maazị Pius na Ezinne Bernadette Ezeoke ndị Umugama Umuchu.

Ọ gụrụ akwụkwọ na ‘Queens School Enugu’ na ‘Federal Polytechnic, Nekede’. Ọ lụlụ ọlụ ọtụtụ afọ n’ụlọọlụ ‘Nigeria Immigration’.

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here