N’OGE mbụ, ụmụnwaanyị na-aza oriakụ ma na-erikwanụ akụ ahụ n’ezie. Mgbe ahụ ihe dị mma, ọlụ nwaanyị na-abụkarị ịmụ nwa, ịzụ nwa na ije ozi ụlọ dị iche iche ma lekọtakwa di ya anya. Ma taa, ihe agbanweela, ụmụnwaanyị na-akpatazị akụ akpata ọ bụghị sọ inyere di ha aka.
N’oge mbụ, nwaanyị na-enyere di ya aka site n’ịlụ ọlụ dị iche iche dịka ọlụugbo, ịzụ ahịa, aka ọlụ dị iche iche w.d.g. Site n’ụzọ dị otu ahụ, ezinaụlọ ha a na-ebu na-enwe aǹụrị. Mana ụmụnwaanyị esila n’oriakụ na onye enyemaka baa n’ide ji ụlọ.
Ụmụnwoke na-achọzị nwaanyị aka siri ike ka ihe ụwa wee dịrị ha mfe, nwoke na-enweta nwaanyị na-enweta ibu adị mfe makana ndị Igbo kwuru okwu sị, aka weta aka weta, akpa eju.
Ọnọdụ ụwa taa mere na ọtụtụ ụmụnwoke chọọ ịlụ nwaanyị, ha achọba onye aka siri ike. Nke ahụ adịghị njọ n’ihi na mgbe ụfọdụ, sọọsọ nwoke na-enweta ego n’ezinaụlọ, ọnaghị ezucha.
Ebe nsogbu dịzị bụ na ọtụtụ ụmụnwoke na-akpachara anya na-anọ nkịtị bido ụtụtụ ruo mgbede.
Ha zụọ ahịa taa, ha anyaa ụgbọala echi, ụbọchị ọzọ, ha agbaa puulu.Echi ha bilie ichọ onye ha ga-alụ, anya ha adị n’ebe nwaanyị aka siri ike nọ. Ihe dị otu a jọrọ nnukwu njọ n’ihi na ihe ụmụnwoke dị otu ahụ bu n’uche bụ nwaanyị ga na-enye ha nrị ma na-alụzi ha ka a ga-asị na ha bụ nwaanyị.
Ọtụtụ ụmụnwoke na-achọzị ịza ọbịageriakụ, Nwaoriri, Oriakụ, ebe ụmụnwaanyị na-azazi ọkpataakụ, Nwaanyịezuike, Agunwaanyị. Ugbu a, e si ugwu-Awusa ebulata ji n’ike n’ike, ilepụ anya n’elu gwongworo,
ịhụ ka ụmụnwaanyị juru na ya ebe ha na-achụ ihe afọ ga-eri. Ụmụnwaanyị ndị ahụ nwechara di n’otu n’otu, ụfọdụ ka di ha na-agba mbọ ebe ụfọdụ bụ ndị agafu na-eghighe eghighe. Ndị kama ọ ga-adọ n’ite ka ọ dọrọ n’afọ.
N’eziokwu, ọtụtụ ụmụnwoke na-agba mbọ akpata ihe e ji azụ ezinaụlọ.Ezinaụlọ dị otu ahụ enweghị nsogbu. Udo na-adị na ya maka na onye ọbụla na-eme ihe ruuru ya. Di na nwunye dị otu ahụ gbaa izu okwu ha abụrụ otu.
Nwoke lụtara nwaanyị dara ngana nọ na nsogbu n’ihi na ihe na-esiri ya ike karịa. Ụmụnwaanyị dị umengwụ na-ebute ihe isi ike n’ezinaụlọ, ọ bụ ya ka ụmụnwoke ji achọzị nwaanyị aka siri ike.
E mee elu mee ala, ụmụnwoke kwesịrị icheta na nwaanyị bụ onye enyemaka. Aka sigodi nwaanyị ike, nwoke kwesịrị ịnọ n’isi makana ọ bụ nwoke bụ ide ji ụlọ n’ezinaụlọ.