IGBOCHI ịnyụ nsị aghara aghara, ọkachasi n’obodo mepere emepe bụ ihe dị oke mkpa.Ịnyụ nsị n’akụkụ ụzọ, n’akụkụ mmiri ma ọ bụ n’ọwara mmiri si aga adịghị mma. Nke a na-eme ka gburugburu na-esi isi.
Ọzọ, ọ na-eme ka ọrịa na nsogbu dị iche iche na-adapụta n’obodo. Oge ụfọdụ, ị na-aga n’okporo ụzọ, ịhụ nsị ka ekechiri tọgbọ, ụgbọala ria ya elu ma ọ bụ mmadụ zọkwasị ya ụkwụ, ọ gbasaa ebe niile. Nke a jọgburu udele ma sigbuo nkapi n’isi.
Ndị na-eme ihe ndị a abụghị ụmụaka, ha bụ ndị tozuru oke ma mara ihe dị mma. O kwesiri ka tupu onye ọbụla esi be ya pụọ n’ụbọchị ọbụla ka ọ nyụọ nsị na be ya . Nke a ga-enye aka beleta ịnyụ nsị n’okporo ụzọ.
Ụfọdụ ụlọ ebe ha na-anyụ nsị mebie, ha agaghị edozi ya mgbe kwesịrị. Nke a sokwa na-eme ka ụfọdụ ndị bi ebe dị otu a malite ịnyụ nsi na-ekechi. Mmiri zobe, ha ebuputa ha wụnye n’ide mmiri.
O kwesiri ka gọọmenti jide ma kpụrụ onye ọbụla nwere ụlọ n’obodo mepere emepe ma onweghị ebe a na-anyụ nsị ma ọ bụ na omebiri ma edozighị ya.
N’ihi ihe ịsọ oyi a, aka na-achị steeti Ondo nọrọ na nsonso a kwuo ma mee ya ka ọ bụrụ iwu na ejide onye ọbụla nyụrụ nsị ebe ekwesịghị, na a ga-ekpe ya ikpe dịka ahụhụ njọ ya siri dị.
Ọ dịkwa mkpa na ndị na-achị na mpaghara ala anyị niile ga-eme ya ka ọ bụrụ iwu bụ mmadụ ịnyụ nsi n’ebe ekwesighị ka ihe iso oyi a beleta n’ebe niile.