MMADỤ iri a gbara ọgwụ n’ụlọọgwụ anya na Kaduna e kpuola isi ozugbo a gbachara ha ntụtụ kemgbe ọnwa Mee. Ndị ahụ niile kpuru isi bụ ndị na-abịabu anara ọgwụ n’ụlọọgwụ anya ‘National Eye Centre’ Kaduna.
Ozugbo ya bụ ihe mechara, ndị ụlọọlụ na-ahụ maka erimeri na ọgwụ bụ ‘National Agency for Food na Drug Administration and Control’ (NAFDAC) gbatara ozugbo ma were ọgwụ ahụ maka nnyocha.
N’ihi mgbagwoju anya maka ya bụ ihe, ndị nlekọta ụlọọgwụ ahụ debere ndị ahụ niile kpuru isi na-enye ha nri na ọgwụ n’efu iji nye aka ka ha hụbakwa ụzọ ọzọ.
Ndị ahụ kpuru isi kwuru na o nyeghị ha ọnụ okwu, na ha amaghị ihe mere ha niile ji kpuo isi ụbọchị ahụ a gbachara ha ọgwụ nke sitere n’otu olilo (bottle), ebe ndị nlekọta ụlọọgwụ ahụ kwuru sị na ha na-anwa ike ha iji hụ na ndị ahụ niile bidokwara hụba ụzọ.
Onyeisi ndị dibia oyibo n’ụlọọgwụ ahụ bụ Dọkịnta Mahmoud Alhassan kwuru na ụlọọgwụ ahụ dịbu mbụ agba ndị mmadụ ọgwụ ahụ n’enweghị nsogbu ọbụla.
O kwuru si: “ọgwụ ọgbụgba ahụ (injection) nke a gbara ha bụ nke a dịbu mbụ agba ndị ọrịa anya iji belata ọbara nke na-agba n’anya, ọkachasị ndị na-arịa ọrịa shuga (diabetics) na ndị ọzọ.”
Ọ gakwara n’ihu kwuo na nke ahụ abụghị mbụ ụfọdụ n’ime ha na-agba ọgwụ ahụ.
Alhassa kwere nkwa kwuo na ha ka ga-ehichasị anya ndị ahụ nke bụ na ha ga-emechaa hụkwa ụzọ.
Ndị ahụ kpuru isi n’ike na-ajụ ajụjụ sị “olee otu anyị si jiri anya anyị abụọ na-ahụ ụzọ bịa ka e nyere anyị aka ma e meziri ọnọdụ anyị ka ọ kawanye njọ nke bụ na anyị anaghị ahụzị ụzọ.”
Maazị Zakariah Idzy, onye steeti Kaduna bụ otu onye n’ime ndị ahụ kpuru isi ma bụrụkwa onye na-anya ‘keke’ kwuru na ọ bụ ikwu na ibe ya nyeere ya aka inweta akatamkpo ego a nara ya n’ụlọọgwụ ahụ maka ntụtụ ahụ.
Ọ kọwara na ha chọburu ịwa ya anya (operation) ma mechaa kpebizie ịgba ya ntụtụ ugboro ugboro.