NDỊ ọlụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation’ (ANPC)’ bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ ‘National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportsLightxtra’a malitela ọmụmụ na nkuzi agba nke abụọ maka otu e si alụ ma na-agbakọ ego ndị na-ala ezumike nka n’ọlụ oyibo. Ọmụmụ ihe ahụ bụ nke bidoro ụbọchị Monde.
Onye isi ụlọ ọlụ ahụ bụ Sir Chuka Nnabuife na ndị ọlụ niile ma ndị ngalaba ha nọpụrụ anọpụ (out station) sonyere na ya. Nnabuife nọrọ n’oge nguzobe ọgbakọ ahụ wee kwuo ebumnobi ya ime ka ndị ọlụ ANPC mara ka e si alụ ma na- agbakọ ego ndị na- ala ezumike nka n’ọlụ oyibo. Ọ siri na ọmụmụ ihe a ga-ewe otu izuụka, okwuru na nke a bụ iji mee ka ndị akụziiri ihe n’afọ gara aga na ndị nke ọhụrụ ghara ichezọ ihe ọbụla akụziri ha.
Onye isi ụlọ ọlụ a gara n’ihu kwuo na ihe ya ji agba mbọ a niile bụ na ya achọghị ka ọ nwee onye ga-enwe nsogbu mgbe ọ ga- ala ezumike nka n’ọlụ, na ya chọrọ ka onye ọbụla mara ihe o kwesiri ịma nakwa ihe niile o kwesiri ịhazi tupu o ruo mgbe ọ ga-akwụsị ọlụ.
Maazị Jude Anadi nọ dịka onye nkuzi n’ọgbakọ ọmụmụ ihe ahụ kelere ndị ọlụ niile ma kọwaara ha maka okwu akpụ n’ọnụ (pension). Ihe ọ pụtara bụ ihe ụlọ ọlụ ga-enwe ka ha wee sonye na ndị a ga-akwụ ego ezumike nka. Ha na ndị ‘Ministry’ ga-enwe otu akwụkwọ usoro ọlụ, ha ga-anakwa otu usoro ụgwọ ọnwa n’ihi na ndị ụlọ ọlụ a nwere akwụkwọ ndị ahụ niile na ọ bụ ya mere ha jiri tozuo ịna ụgwọ ezumike nka.
Ọ gara n’ihu kọwaa na ihe ọzọ ndị ANPC jiri tozuo bụ na ha enweghị nnukwu ihe ha ji akpata ego, ọzọ na ha na-alụlụ gọọmenti ọlụ dịka ndị nọna ‘Ministry’.
Comrade Anadi nọrọkwa n’oge ahụ too aka na-achị steeti Anambra bụ Willie Obiano maka otu o siri gboo mkpa ndị ANPC n’oge a. Ọ siri na nke a gosiri na o nwere obi mmadụ. Anadi rịọkwara ndị a ga-akụziri ihe ka ha gbasie mbọ ike ịmụta ihe a ga-akụziri ha. Mmadụ iteghete ka akpọrọ isoro nara ọmụmụ na nkuzi a.
Nwaada Josephine Maduakọnam sịrị na obi dị ya ụtọ nke ukwu na ya so na ndị ga-anara ọzụzụ a. ọ siri n’ezie a na ihe ọmụmụ a ga-eme ka ya mara ụfọdụ ihe gbasara otu e si alụ ma na-agbakọ ego ezumike nka. Ọzọ, ihe ọmụmụ a mere ka ya mara usoro esi eme mbuli elu n’ọlụoyibo.
Nwaada Obianuju Nwanna kwuru n’ezie na obi dị ya ụtọ na ya so rita elele a bụ ịmụ ihe gbasara ịgbakọ ego ezumike nka n’ọlụ oyibo. O kwuru na ya na-ebunye onyeisi ụlọ ọlụ a bụ Chuka Nnabuife ụkpa ekele n’ihi ịgụnye ya na ndị ga-eso rite elele na nkụzi a ya na ezi echiche ọ na-echere ndị ọlụ ya niile. Ọ gara n’ihu sịna ohere a ya nwetara ga-eme ka ya mara ihe ya amaghị na mbụ. Nwada Uju kwere nkwa na ya ga-agbasi mbọ ike ịmụta ihe a ga-akụziri ha n’oge ọmụmụ na nkuzi a.