September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Obianọ agbapeela izuụka ahụike nne na nwa

Gọvanọ Obiano, mgbe ọ na-ekwu okwu na mmemme ahụ.

AKA na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ agbapeela agba nke mbụ nke amụmà izuụka ahụike nne na nwa na steeti ahụ.

Mgbape amụmà ahụike ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’Otolo Nnewi dị n’okpuru ọchịchị ‘Nnewi North’, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị ikpùchi ikpùchì mmadụ e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ, nke gụnyere: aka chịbụrụ steeti Anambra n’oge mbụ, bụ oriakụ Virgy Etiaba; kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ahụike, Dọkịta Vincent Ọkpala; eze ọdịnala Nnewi, bụ Igwe Kenneth Orizu, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ okwu ha na-ada gbowàm.

N’okwu ya oge ọ na-agbape ya bụ amụmà, gọvanọ Obianọ kọwara oke mkpà ezi ọnọdụ ahụike dị na ndụ mmadụ ọbụla, ma kwuo na ọ bụ nke ahụ mere ọchịchị ya jirila gbaa ma ka na-agbakwa ọtụtụ mbọ esepughị aka iji wee kwàlite ngalaba ahụ site n’ịhụ na ha nwetàzùrù akụrụngwa na ihe ndị ọzọ dị iche iche dị oke mkpa n’ime ka ọnọdụ ahụike na steeti ahụ bụrụ ejiama atụ.

O mere ka a mara na ụmụaka karịrị ndè abụọ n’ọnụ ọgụgụ esonyela n’ịgba ọgwụ mgbochi na steeti ahụ kemgbe ahọ 2014, ma kpọkùzie ndị nne na nna ka onye ọbụla kpọpụta nwa ya ma gbaa mbọ hụ na o sònyesiri ike n’amụmà ahụ.

N’okwu nke ya, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ahụike, bụ dọkịta Ọkpala kwùrù na amụmà ahụ ga-enye aka n’ụzọ dị ukwu n’ime ka ịgba ọgwụ mgbochi na steeti ahụ siwanye ike, bèlata ọnwụ ụmụaka, ma sikwazie n’ụzọ dị otu ahụ kwàlite ọnọdụ ahụike ọhanaeze. Ka ọ na-akpọ òkù ka e nwee nsonyesi ike ndị nne na ụmụ ha n’amụmà ahụ, ọ gara n’ihu gosiputa ezi olile anya na ha ga-agbatịwanyekwu aka na nke ahụ n’ọdịnihu.

Na mbụ n’okwu ya, ode akwụkwọ ukwu n’ụlọ ọrụ “Anambra State Primary Health Care Development Agency” bụ dọkịta Chiọma Ezenyimụlụ, onye kpọpụtasịrị ụfọdụ ọmarịcha atụmatụ dị iche-iche ha na-abagide na ya iji hụ na ndị Anambra nwere ezi ahụike, jikwara ohere ahụ chetara ọhanaeze na amụmà izuụka ahụike ahụ bụkwa n’efù, ọbụnadị dịka ọ rịọrọ ka onye ọbụla o metụtara sonyesie ike na ya, maka na ọchụpụrụ onwe ya n’ụgbọ apụghịkwa ịsị na ụgbọ eruteghị ya.

 

%d bloggers like this: