September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Otu a ga-esi gbochi nsogbu n’omenala ụfọdụ n’ala Igbo

OBODO niile dị na mba ụwa nwere omenala ha na-eme. Omenala pụtara ka ndị si eme, ihe ndị kwenyere, ka ha si akpa agwa, ka ha si ebi obi na ka ha si ebi ndụ, ụdị egwu ha na-agba na ejiji ha na-eji nakwa ekike ha na-eke. Nke a mere obodo ọbụla ihe ha bụ.

Omenala na ọdịnala na-eyibe onwe ha mana otu ihe ọdịnala jiri dị iche bụ na obodo adịghị achọ igbanwe ọdịnala ha ma ọ na-emegide ha ma ọ bụ na ọdịghị emegide, iji ma atụ, ọdịnala ‘Zuma Rock’, ndị na-eme ya ka na-agba ọtọ eme ya. N’agbanyeghị na ebe ahụ emepeela, ha achọghị ịgbanwe ya maka na ọ bụ otu nna nna ha si eme ya.

Mgbe ochie, ọ dị ụfọdụ omenala a na-eme dị mma ma na- atọ ụtọ, mgbe ọbụla ha ga-eme ya n’afọ, ndị niile bi ha gburugburu ga-esonyere ha na- enwe ọṅụ. E mee omenala dị otu a, ha akpọọ ndị enyi ha na ndị ọgọ ha ka ha bịa soro ha ǹụrịa, ha risie nri, e duru ha gaba n’ama obodo ahụ ebe a na-egosi egwuruegwu dị iche iche.

Dịka anyị maara na ụfọdụ omenala na-eti mmọnwụ, ụmụnwoke na ndị ikorobịa buru mmọnwụ ha na-agba egwu, ndị mmadụ a na-ekiri ha. Ụmụikorobịa na-anoro n’oge mmemme ahụ ele anya nwaanyị ha ga-alụ maka na onye ọbụla na-apụta n’ama obodo.

Mana isiokwu n’ihe odide a bụ otu a ga-esi gbochie nsogbu n’omenala ụfọdụ. N’ezie, nsogbu a adịghị mma chaa chaa, nsogbu na-ebute ọnwụ, ịlụ ọgụ, igbu ọchụ nakwa esemokwu.

N’ihi nke a, ndị na-achị n’obodo ọbụla a na-enwe nsogbu n’omenala ha kwesịrị ịchọ ụzọ ka mma ha ga-esi na-eme ya. Oge ụfọdụ, nsogbu ahụ pụta, ọbụrụ onye atụbaghị anya ka ọ na-adakwasi; iji maa atụ,

n’Enugu na mpaghara Nkanu East, ọ dị omenala ha na-eme a na-agba mgba na ya, mana a na-agba mgba ahụ, mgbe ụfọdụ, a tuo mmadụ n’ala, ọgaghị ebilite ọ nwụọ. Ụfọdụ agbajie aka ma ọ bụ ụkwụ. Ọ bụ nke a mere na ọdịghị onye na-apụta ịgba mgba ọzọ, mgba si otu ahụ kwụsị n’omenala ahụ.

N’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, o kwesịrị ka ha mara na ọbụzịghị sọọsọ ha bi n’Awka; ọzọ, o kwesịrị ka ndị na-achị Awka leba anya  n’akparamagwa ụmụntorobịa ha na-egosi n’oge omenala Imoka ha.

N’ezie igbu mmadụ adịghị mma ma ọ bụ onye bịara abịa ma ọ bụ onye nwe ala.

Ọdịghị omenala kwadoro igbu mmadụ ma ọ bụ imebi ihe maka na ha na-eme omenala. N’oge mmemme a, ọtụtụ ndị ntorobia adịghị echeta na onye nwụọ na ọ gaghị esoro mee omenala nke afọ ọzọ.

Ọdịghị mma mmọnwụ na-aga, ọ na-enye nsogbu n’okporo ụzọ, ndị so ya a na-eti onye esoghị ha osisi.  Ịnara ndị ụgbọala ndị na-aga n’ụzọ ego n’ike, igbu mmadụ na iti onye esoghị ha osisi kwesịrị ịkwụsi kpamkpam.

Gọọmenti Anambra na ndị na-achị Awka kwesịrị ileba anya n’akparamagwa mmọnwụ na ndị ntorobịa n’oge mmemme a iji chọọ ụzọ ka mma a ga-esi na-eme ya.

%d bloggers like this: