OTU nwaanyị agbahapụla nwa nwaanyị ọ mụrụ n’ụlọ ahụike ‘Primary Health Care Centre’ nke dị n’Obiuno Osumenyi okpuru ọchịchị Nnewi ‘North’ na steeti Anambra.
Ozi si n’aka onye na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ na ndị uweojii na steeti Anambra bụ Haruna Mohammed kwuru na ndị uweojii na-ahụ maka ụdị ihe ahụ ‘Juvenile and Welfare Unit’ ngalaba Osumenyi gara n’ebe ahụ; ebe a na-agbazi mbọ ijide nwaanyị ahụ nọ n’ọsọ iji kpee ya ikpe.
Onye uweojii ahụ gara n’ihu kwuo na mkpesa ha nwetara kwuru na nwaanyị ahụ nke amaghị onye ọ bụ gbabatara n’ụlọọgwụ ahụ mgbe ọ nọzi n’ọnọdụ ịmụ nwa. Ndị ọlụ ụlọọgwụ ahụ nyeere ya aka o wee mụọ nwa nwaanyị n’udo ka ọ gachara nkeji iri na ise, ebe ndị nọọsụ hapuru ya ma na-elekwa ndị ọzọ, o rie mbọmbọ ọsọ.
O kwuru sị: “N’oge eteghị aka o ji mụcha nwa, nwaanyị ahụ gbahapụrụ nwa ọhụrụ ahụ ma tinye isi ebe mmadụ amaghị ma hapuzie nwa n’aka ndị nọọsụ ụlọ ahụike ahụ.
Dịka o si kwu, a na-akwadobe ịhafe nwa ahụ n’aka ndị na-elekọta ụmụaka enwe nne na nna nke gọọmenti (government orphanage) maka nleta.