A NA-EME nnyocha ugbua gbasara mkpesa e nwetara na ọzọdịmgba eloola nde naịra asaa (seven million naira) n’ebe a na-echekwa ụmụanụmanụ (zoo) nke dị na Kano.
Onyeisi ụlọ anụ ahụ ‘Kano zoo’ bụ Umar Kashekobo kwuru sị “Ndị uweojii na-enyocha ihe merenụ, ihe m nwere ikwu bụ na ego na-efu.”
Onye okwupụta okwu ndị uweojii na Kano bụ Abdullahị Kiyawa kwuru sị na ego abalị ise a natara na geeti (gate fees) furu efu.
Ọ gwara ndị nta akụkọ na anwụchikọọla mmadụ iri maka nke ahụ ma kwukwaa na a na-emekwa nnyocha iji chọpụta ihe mere e ji debe nnukwu ego ahụ n’ụlọọlụ ahụ karịa idebe ya n’ụlọakụ.
N’ajụjụ ọnụ a gbara otu onye nọ na ngalaba na-ahụ maka ego n’ụlọọlụ ahụ, o kwuru na ọzọdịmgba mịbatara zuru ma loo ego ahụ.
Ozi e nwetere n’ikpeazụ site n’aka onye is ebe ahụ na-akọwa na ọ bụ ndị ohi zuuru ego ahụ.O kwuru hoo haa na ha enweghị ọzọdimgba n’ụlọ anụmanụ ahụ.Otu o sila dị, a na-eme nnyocha maka ohi ahụ ugbu a.
Ka anyị cheta n’afọ gara aga na otu onye ọlụ na ‘Nigeria’s National Exam Board’ na steeti Benue kwuru na agwọ batara n’ebe ahụ ma loo nde naira iri atọ na isii (36million naira) bụ ego ule.