AKPỌỌLA oku ka ngalaba na-ahụ maka mmụta (Ministry of Education) kwado mkpụrụ edemede Igbo A,B,CH, D n’ụlọakwụkwọ nke prima niile nke dị n’ala Igbo. Imalite ikuzi mkpụrụ edemede Igbo n’ụlọakwụkwọ niile dị n’ala Igbo ga-enye aka mee ka nwa afọ Igbo ọbụla mara ka e si ede ma na- agụ asụsụ Igbo n’oge na mgbe ọbụla.
Nwaamadi aha ya bụ Pius Ofuonye, bụ onye lagoro ezumike n’ọlụ nkuzi sịrị na amaghị otu e si agụ mkpụrụ edemede e ji ede asụsụ Igbo bụ ihe kpatara n’ụfọdụ mmadụ amaghị ka e si ede ma ọ bụ agụ ihe e dere n’asụsụ Igbo. Nwaamadi a sịrị na ihe ọzọ kpatara asụsụ Igbo anyị jizi ada ada ugbu a bụ na ọdịghịzị onye na-achọ ime asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ niile dị n’ala Igbo. Ọtụtụ mmadụ chere na ọdịghị ebe e ji asụsụ Igbo eje, mana ọ bụ asụsụ onye ka e ji ama ebe o si pụta.
N’ezie asụsụ niile ọbụla dị mma tinyere ka ndị siri were asụsụ ha maka na okwu Igbo sịrị na onye kpọọ ọba ya mkpọkọrọ, agbataọbị ya ewere ya kpoo ntụ.
Oke nlepu anya nke ndị nwe asụsụ Igbo lepuru mkpụrụ edemede e ji ede asụsụ Igbo bụ nnọọ ihe jọgburu onwe ya na mpaghara ala Igbo niile.
Maazị Ofuonye sịrị na ya agbaala mbọ ime ka asụsụ Igbo bụrụ nke guzosiri ike. O kwesiri ka ụmụ afọ Igbo niile nabata mbọ ndị a niile ime ka asụsụ e jiri mara anyị ghara ịla kpamkpam. Ọ bụrụ na ndị na-ahụ maka agụmakwụkwọ n’ala anyị agbaghị mbọ otu o kwesiri ugbu a kwalite ikuzi mkpụrụ edemede e ji ede asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ, ọkachasi na ịmalite agụmakwụkwọ ụmụaka prima ruo sekọndịrị, a ga-enwe oke ọdịda nke asụsụ Igbo n’ọdịnihu.
Mana ọ bụrụ na ndị nkuzi nye aka n’ikụzi mkpụrụ edemede e ji ede asụsụ Igbo nkeọma n’ụlọakwụkwọ niile dị n’ala Igbo, nke a ga-enye aka kwalite ọdị mma nke asụsụ Igbo n’ebe ọ dị ukwuu.
Ndị ọcha bụ ndị otu C.M.S na R.C.M maara uru asụsụ ọbụla bara, ọ bụ ya mere na ha gbara nnukwu mbọ otu ha nwere ike ime ka e nwee mkpụrụ edemede e ji ede asụsụ Igbo. Kedụzi ka anyị bụ ndị nwe asụsụ Igbo ga-esi lepuru asụsụ anyị anya n’ụzọ dị otu a.
Ndị mpaghara ọzọ na Nigeria n’agbanyeghị otu ha siri gụọ akwụkwọ ha adịghị echefu asụsụ ha ma ọ bụ ka e si ede ma na-agụ asụsụ ha.
Nwaamadị a bụ Ofuonye wee na-arịọ ka ndị na-ahụ maka agụmakwụkwọ n’ala Igbo niile kwado agụm mkpụrụ edemede e ji ede Igbo n’ụlọakwụkwọ niile dị n’ala Igbo ka asụsụ anyị ghara ifunarị anyị.
Igbo sịrị na a nyụkọọ amịrị ọnụ, ọ gbọọ ụfụfụ nke pụtara na onye ukwu na onye nta malite n’ezinaụlọ niile jikọọ aka ọnụ ka asụsụ anyị gaa n’ihu.