September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Anyị agaghịzị eziga onye ọbụla na mpaghara ogbu mmiri – NYSC Delta

DỊKA a sị na ọ na-aka mma ịgbanahị ihe izè ndụ, karịa ízè ndụ n’ihu ọnwụ, isi ọchịchị òtù ahụ na-elekọta ndị ahụ ji otu ahọ éfè ala nna anyị, bụ nke a maara na bekee dịka ụlọ ọrụ ‘National Youth Service Corp’ ngalaba steeti Delta emeela ka a mara na ha agaghịzị ezìga onye ọbụla ji otu ahọ efe ala nna anyị gaa na mpaghara ebe ahụ ogbu mmiri dị.

Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’ọnụ òsòtè onyeisi nchịkọta na-ahụ maka izipù na izìgà ndị ahụ gaa n’ebe ha ga-anọ wee fèé ala nna ha, bụ oriakụ Ngọzị Akụagbaọgụ, n’ọgbakọ nkuzi a chịkọbààrà ndị ahụ n’ogige ụlọ ikwúù ebe ha na anata ọzụzụ, dị n’Issele-Uku, n’okpuru ọchịchị Anịọcha North.

Oriakụ Ngọzi mere ka a mara na ọ bụ ihe na-echu ha ụra oge ọbụla ịhụ na ndị ahụ ji otu ahọ efe ala nna anyị na steeti ahụ nwèrè ezi ọnọdụ obibi ndụ, ma nọrọkwa n’ahụ dị mma oge niile, ọbụnadị dịka o  kwurù na gọọmenti steeti ahụ na-enyekwa ndị ahụ ego mmachi akpa dị puku Naịra ise kwà ọnwa ọbụla, tinyéré nke gọọmenti etiti na-akwụ ha.

Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụkwà naanị  ụzọ ihe atọ ka a na-agbakwàsa ụkwụ tupuu e zipùgharịa mmadụ ọbụla ji otu ahọ efe ala nna anyị ma zìgagharịa ya ebe ọzọ. Ihe ndị ahụ, dịka o sìrì kọwaa bụ ajọ ọnọdụ nchekwa, ajọ ọnọdụ ahụike, alụm di na nwunye, ma ọ bụkwanụ afọ ime. O tòkwàzịrị ndị ahụ ji otu ahọ efe ala nna anyị, gọọrọ ha ọfọ ogogo ndụ, ma kpee ka ọnụnọ ha na steeti ahụ bụrụ sọ mma.

%d bloggers like this: