OKE ọñụ dara nnọọ n’isi ngwụcha izuụka gara aga na Nsugbe, dị n’okpuru ọchịchị ‘Anambra East’ na steeti Anambra, dịka mmadụ karịrị otu puku n’ọnụ ọgụgụ nwetàrà nnyòcha ahụ ma natakwa ọgwụgwọ maka ọrịa ịbà n’efù.
Inyòcha ahụ na inye ọgwụgwọ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ogige Abito Nsugbe, ma bụrụkwa nke e mèrè n’aha onyeisi ọchịchị obodo ahụ lagoro mmụọ, bụ maazị Frank Owelle.
N’okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ịchụ ọrịa ịba ọsọ ụkwụ erughị ala, bụ ụlọ ọrụ ‘Roll Back Malaria’ n’okpuru ọchịchị Anambra East, maazị kwuru na ebumnobi ọrụ obi ebere bụ iji wee belata otu ọrịa ịba si agbasàwanye n’ike n’ike ụbọchị ọbụla.
O mere ka a mara na nke ahụ bụ agba nke abụọ ha na-achịkọba ihe mmemme ahụ, bunye ezinaụlọ maazị Frank Owelle na ndị òtù isi ọchịchị obodo ahụ, bụ ‘Nsugbe Development Union’ maka ịtụpụta na ịkwàdo ọmarịcha atụmatụ ahụ, bụ nke o kwùrù na o nyela aka n’ụzọ pụrụ iche n’ibibì na imeṅémìlà ọrịa ịbà n’obodo ahụ.
Na ntụnye nke ya, onyeisi oche nchere oge òtù ‘Nsugbe Development Union’, maazị Simeon Ogude kwùrù na e kesàrà ọgwụ gburu ego ruru puku narị Naịra asaa na iri ise n’agba nke mbụ nke ihe mmemme ahụ, ebe e kesàrà ọgwụ gburu ego ruru nde Naịra ise na narị Naịra ise na nkeṅahọ a, ma kpọkuo ha ka ha jide ka ha jì.
Ode akwụkwọ otù ahụ, bụ maazị Ken Ezeanwụ kọwapụtara mkpà ọ dị ịhụ na ndị obodo Nsugbe nwere ezi ọnọdụ ahụike na ezi ọnọdụ obibi ndụ, dịka o siri bụrụ mmasị na ọchịchọ obi nke ọchịchị nọ ugbua n’obodo ahụ, makwazie n’ihu tòó ndị obodo ahụ na ndị ezinaụlọ maazị Owelle maka ọnụnụ ọkụ n’obi ha ime ka nke ahụ pụta ìhè.
Ụfọdụ n’ime ndị ritara urù na ya bụ ihe mmemme, nke gụnyere oriakụ Bridget Emoh na oriakụ Ukamaka Aniekwe kèlèrè ndị kwadoro ihe mmemme ahụ, bụ nke ha kọwara dịka nke magburu onwe ya, ma kpee ka Chineke gaa n’ihu ịgọzi ha niile n’otu n’otu.