NDỊ bị n’Asaba, isi obodo steeti Delta na gburugburu ya ka na-akwa arịrị n’ihi mkpamkpa ide mmiri kpara n’ebe ahụ n’ihi oke mmiri ozizo nke zoro abali atọ.
Mmadụ abụọ ka e kwuru na ha tufuru ndụ ha n’ihi ya bụ ọdachị. Ha bụ otu nwoke nọ n’agbata etiti (middle aged) na nwata nwaanyị dị afọ iri.
Oke ide mmiri buuru nwoke ahụ (Hassan) n’ike, ọ bụ eziokwu na a gbalịrị zọpụta ya ma ọ nwụkwara ozugbo.
Nwata nwaanyị ahụ bụ onye nke e kwuru na nne na nna ya adịlarị na mbụ nwụọ, danyere n’ime ide mmiri n’Okpanam ebe o buuru ya tinye isi n’ọwa mmiri a na-alụ ọhụrụ n’okporoụzọ sị Okpanam gaa Asaba tupu ọ tụhapụ ozu ya n’otu ebe.
Ọtụtụ ndị mmadụ kwara arịrị ka mmiri siri chụpụ ha n’ụlọ ma mebichaa ngwongwo niile ha jiri biri.
Otu onye ọlụaka aha ya bụ Chika Onadeko kwuru na ide mmiri ahụ kpara ike dị egwu. Ọ kọwara na ha ka nọ n’ọlụ oge ọ malitere, wee buru ọtụtụ ngwongwo o ji alụ ọlụ.
N’okporoụzọ gara ‘Delta Broadcasting Service’ (DBS) bụ redio steeti ahụ, otu akụkọ ahụ ka a na-akọ. Ide mmiri kwooro nubaa n’ime DBS wee mebichaa akọrọngwa dị iche iche ma chụpụ ndị niile nọ ọlụ.
Ka anyị cheta na ide mmiri gbagburu ụmụnne abụọ n’Agbor n’izuụka gara aga.