September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Mbụgharị Nigeria bughàrịrị ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya

KA Ọ dị taa, ọ bụghụzị akụkọ ọhụrụ na ala Nigeria ebugharịala mgbe e ji emerùbezị ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya. Ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya bụ oke ụbọchị pụrụ iche n’ala Nigeria, n’ihi na ọ bụ ncheta ụbọchị ọchịchị ndị nkịtị laghachitakwara azụ n’ala ahụ, ka ọ gachara afọ kwùrú afọ ndị agha weghààra ọkwa.

Nigeria, dịka mbà nwèèrè onwe ya pụọ n’aka ọchịchị ndị ọcha n’abalị mbụ nke ọnwa nke iri n’afọ 1960, bụ oge ụmụafọ Nigeria wèghàrà ọkwa ọchịchị ala ha.

Ka ọ gachara mkpụrụ afọ ole na ole nke ahụ mechàrà (Jenụwarị 15th1966), ndị agha ala anyị gbawara ndị nkịtị aka, ma weghara ọkwa ọchịchị.

Ọchịchị ndị agha ahụ bụzị nke dịgidere gachaa ogologo afọ niile a lụrụ agha Nigeria na Biafra (1966-1970) wee ruo n’afọ 1979, bụ mgbe ọchịchị ndị nkịtị laghàchikwàrà azụ n’ihi nhọpụta izugbe e mere, bụ nke Maazị Shehu Shagarị na Dọkịta Alex Ekwueme nọrọ na ya wee tute ùgò dịka onyeisi ala na òsòte onyeisi ala n’ótù n’ótù.

Nke ahụ bụ nke ùgbòrò abụọ ndị nkịtị na-ewèghara ọkwa ọchịchị ala Nigeria. Ka  ọ fọdụrụ áwà ole na ole ka afọ 1983 bịa na njedobe (n’abalị iri atọ na otu nke ọnwa Ekeresimeesi), ndị agha wụbàtàrà ọzọ ma wegharakwa ọkwa ọchịchị, bụzị nke dịgidere n’aka ha wee ruo n’afọ 1999, bụ mgbe ọchịchị ndị nkịntị chighatakwara ọzọ n’izùgbe, na-agbanyeghị na e mèrè nhọpụta izugbe ọzọ n’afọ 1993.

E nyefèrè ndị ahụ tuuru ùgò, bụ nke Maazị Olusegun Ọbasanjọ nọ n’isi ya ọkwa ọchịchị n’abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Mee afọ 1999.Ọ bụ n’iji kwanyere oke ụbọchị ahụ (Méè 29th) ùgwù, ka e jiri kwuwazie ya dịka ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya na ụbọchi ezumike n’ala anyị, n’ihi na ọ bụ ụbọchị ahụ ka ndị ọchịchị onye kwuo uche ya chìghàtàrà azụ.

E merùbèrè àgbà nke mbụ nke ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya n’ala Nigeria n’abalị iri abụọ na iteghete n’afọ 2000.

Ọ bụzị malite na mgbe ahụ ka e bidòzịrị imerùbè ya kwà afọ ọbụla, wee ruo n’afọ 2018, bụ mgbe egwu dàghàrịrị.N’abalị isii nke ọnwa Juun afọ 2018, bụ abalị nke asatọ e jiri merùbechaa ya bụ mmemme nke afọ ahụ, onyeisi ala Nigeria ugbua, bụ Mụhammadụ Buharị kwuwara na ọ bụzị n’abalị iri na abụọ nke ọnwa Juunu (June 12th)

ka a ga na-emerubezị ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya, na ọ gaghị abụzị n’ọnwa Méè a na-emebụ ya.Nke ahụ, dịka o sìrì kọwaa bụ n’ịkwanyere Maazị Moshood Kashimawo Olawale Abiola (MKO Abiọla) ùgwù, bụ onye e kwùrù na ọ bụ ya tùùrù ùgo dịka onyeisi ala na nhọpụta izugbe ahụ e mèrè n’abalị iri na abụọ ọnwa Juunu n’afọ 1993.

Ya bụ nhọpụta ọkwa ọchịchị a maara dịka nhọpụta Juunu 12 bụ nke mba ụwa kọwara dịka ntuliaka kacha mma na nke kachara ghere anya oghe e mègòrò n’ala Nigeria kemgbe o sìrì nwere onwe ya pụọ n’ọchịchị ndị ọcha. Na nhọpụta ahụ, Maazị Abiọla, nke otu ndọrọndọrọ ‘Social Democratic Party’ (SDP) ka e kwùrù na o mèrìrì onye ya na ya sọrọ mpì ahụ, bụ Maazị Bashir Tofa nke otu ndọrọndọrọ ‘National Republican Convention’ (NRC).

Mana, ka o silà dị, onye jibụ ọkwa dịka onyeisi ala n’oge mbụ n’usoro ọchịchị ndị agha, bụ Maazị Ịbrahim Babangida kàgbùrù ya dịka nke mpụ, aghụghọ na igwù ojoro jupùtàrà na ya, ma kwuo na mpụtara ya enweghịzị isi na ọdụ, na-agbanyeghị na ya na Abiọla bụ ezigbo enyì.

Ọgbọaghara wee daa.Nke a mezịrị, n’afọ 1994, Maazị Abiọla nọrọ na Lagos kwuwàa onwe ya dịka onyeisi ala Nigeria, n’ịgbasò mpụtara nhọpụta ahụ.

Ma mgbe ahụ, Maazị Sani Abacha, onye bugharagworo ọkwa dịka onyeisi ala n’usoro ọchịchị ndị agha n’oge ahụ hụtàrà ma kọwaa nke ahụ dịka mmadụ ịgba gọọmenti mgba, nke mezịrị o jìrì zipù ndị uwe ojii n’ụgbọala ruru narị abụọ n’ọnụ ọgụgụ, ka ha ga nwụchie ma kpọchie Maazị Abiọla n’ụlọ mkpọrọ.

Abiọla nọrọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ afọ anọ, na-agbanyeghị mbọ niile òtù mba ụwa dị iche-iche na ndị ọnụ na-eru n’okwu gbàrà iji hụ na a tọhàpụrụ ya, bụkwa nke amịtaghị mkpụrụ ọbụla n’ihi na nwa amadi ahụ ekweghị ekwuhàsị nkwuwa o kwuwara onwe ya dịka onyeisi ala na-agbanyèghị nkwà gọọmenti kwèrè inyeghàchi ya ego niile o mefùrù na nhọpụta ahụ. Naanị ihe ọ kpụ n’ọnụ bụ ọchịchị onye kwuo uche ya, inye mmadụ ihe ruuru ya, na ime ihe otu o sìrì kwesi ekwesi.

Ka ọ gachara obere oge onyeisi ala Abacha nwụrụ , Maazị Abiọla nwụkwara ọnwụ gbara ụwa ngharị ụbọchị e kwesiri ịtọhapụ ya kpọmkwem n’ụlọ mkpọrọ, bụ abalị asaa nke ọnwa Julaị, afọ 1998. Ọ nọghịzịkwa na ya bụ ọkwa onyeisi ala, ma ya fọdụzie inwetaghàchi ego niile o mefùrù na nhọpụta ọchịchị ahụ.

Ọ bụzị n’iji kwanyere agụ nwoke a ùgwù, ka onyeisi ala, Buharị jiri lechaa anya n’afọ 2018, wee sị na a ga-ebugharị ụbọchị ahụ a na-emerùbezị ọchịchị onye kwuo uche ya n’ala anyị, ka ọ dịbazie n’ụbọchị ahụ e mere ya bụ nhọpụta nwa amadi tuuru ùgo na ya dịka onyeisi ala, n’ihi na o gosiri nnọọ na ọ bụ dike nke ọchịchị onye kwuo uche ya (Hero of Democracy).

O mezịrị ka a mara na abalị iri na itoolu nke ọnwa Mee (May 29) ga-abụzị naanị ụbọchị a ga-enyefè ọkwa ọchịchị n’aka ndị tuuru ùgò na nhọpụta izugbe. N’iji merùbe nke a, àgbà nke mbụ na mbụ ya, abalị iri na abụọ nke ọnwa Juunu afọ a bụ oke ụbọchị n’ala Nigeria, dịka ụmụafọ Nigeria na ndị ọzọ sitere mba dị iche iche n’ụwa gbaa gburubguru wụchàrà n’Abụja bụ isi ala anyị wee mee mmemme dịịrị ya bụ oke ụbọchị.

N’okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi Buharị mere ka a mara na ya adịlarị na mbụ bugharịa ụfọdụ ihe e kwèsiri ime ụbọchị ahụ e nyefèrè ya ọkwa ọchịchị nke ugboro abụọ, bụ Mee 29, ka ha dịbazie n’oke ụbọchị ahụ.

Ọ nọkwazịrị n’ebe ahụ wee kwunwèé ihe ahụ o kwùrù oge e duru ya n’ihu ọrụ agba nke mbụ ya, sị na ya dịnyèrè mmadụ niile ma na ya adịnyereghị onye ọbụla iche, ọbụndị dịka o kwèrè ụmụafọ ala Nigeria nkwà ime ka onye ọbụla na mpaghara ọbụla rite uru na èrèrè ọchịchị onye kwuo uche ya karịa n’agba nke abụọ nke ọchịchị ya.

Ka ọ dị taa, onye ọbụla tọzịrị ntị n’ala ma na-atụzịkwa anya ịhụ ka onyeuisi ala mezùrù okwu ya, hazigharịa ihe ndị ọzọ emetechaghị otu o siri kwesi n’oge gara aga, ma mekwazie ka ọchịchị onye kwuo uche ya siwanye ike n’ala anyị, dịka ọ gbàgòrò afọ iri na abụọ o jiri bido. Ọkachasị site n’ịhụ na e mere nwata ka e mere ibe ya.

Nke a ga-amagbu onwe ya ma e mee ya, ọkachasị ugbua e bugharịgoro ụbọchị a na-emebụ ya ka ọ dịzie na Juunu 12, n’ịkwanyere Abiọla ùgwù, nke na-egosi na gọọmenti ekwetela na ha emeghị ihe otu o siri kwesi n’afọ 1993.

%d bloggers like this: