NDỊ uweojii anwụchikọọla otu nwaanyị tọọrọ nwa a mụrụ ọhụrụ na Jos, isi obodo steeti Plateau.
Nwaanyị ahụ aha ya bụ Oriakụ Lerishimwa Diyal, gbara afọ iri atọ na abụọ zuuru nwa ọhụrụ ahụ ka ọ gachara abalị atọ nne ya bụ Oriakụ Mary Chukwuebuka mụchara ya n’ụlọọgwụ ‘Plateau Specialist Hospital, Jos’.
Diyal (nwaanyị zuru ohi nwa) yiiri akwa njirimara ndị ọlụ ahụike wee bata n’ụlọọgwụ ahụ nara nwata ahụ n’aka nne ya n’ụdị na ọ bụ onye ọlụ ebe ahụ na ọ chọrọ ikuru ya gaa mịrị ya ọbara maka nnyocha.
Otu ahụ ka o siri zuru nwata ahụ wee gbapụ ọsọ gaba n’ụlọọgwụ ọzọ ‘Bingham University Teaching Hospital, Jos’ ebe ọ gwara ha na ndị ntọrị (kidnappers) tọọrọ ya, ọ nọrọ ebe ahụ mụọ nwa ka di ya nyechara ha ego dịka ha siri chọ.
Ụlọọgwụ ebe nke a bụ ebe e kwuru na nne ya na-alụ ọlụ dịka nọọsụ.
Otu o sila dị, a nwụchikọrọ ya site n’ịma imi n’ala nke ndị uweojii ka e nwetachara ozi na a na-achọ nwa ọhụrụ a mụrụ na ‘Plateau Specialist Hospital, Jos’ achọ.
Ka e mechara nnyocha, ilele ọbara ụmụnwaanyị abụọ ahụ, kpọrọkpọtọ gbara n’ihu ehi, eziokwu wee pụta ihe.
Nwaanyị ahụ zuru ohi nwa na-agụ akwụkwọ na ‘College of Health Technology Zawang’ nke dị n’okpuru ọchịchị ‘Jos South’ kwuru na ọ bụ ihere na mwute na ya anọọla afọ asatọ n’enweghị nwa tinyere ya n’ime ajọ ihe ahụ.
Kọmishọna ndị uweojii na steeti Plateau, bụ onye kpụgharịrị ya na Jos kwuru na Oriakụ Diyal kwetere arụ ahụ oge e mechara nnyocha tinyekwara ile ahụ dị na ya bụ okwu. Ọ kọwara na ha chọpụtara na ọ mụbeghị nwa ọbụla mbụ.
Obi gbawara Oriakụ Chukwuebuka oge niile ahụ a na–achọ nwa ọ mụrụ ọhụrụ achọ, ma otu o sila dị, ọǹụ batakwara n’ime ya ka e kunyekwara ya nwa ya ka ọ gachara abalị iri na asatọ a tọọrọ ya.
Onye isi ndị dọkịnta n’ụlọọgwụ ‘Plateau Specialist Hospital, Jos’ bụ Dọkịnta Philimon Golwa kelere Chineke na a chọtala ma hafee nwata ahụ n’aka nne na nna ya bụ Maazị na Oriakụ Nwa Chukwuebuka. O kwuru na ha ga-agba mbọ leruo anya nkeọma iji wee gbochie ụdị ihe ahụ imekwa ọzọ n’ụlọọgwụ ahụ.