E KWURU okwu sị na e kere ọlụ eke. Site n’okike ụwa, Chukwu kere ihe nwoke ga-eme na ihe nwaanyị ga-eme. Ma ọ na-abụ ihe mwute na ị bịa n’ọtụtụ ezinaụlọ, ọ dịka a ga-asị na ọ bụ nwaanyị ka a hapụzịịrị ihe niile.
Nwaanyị ga-alụ di, nwaanyị ga-adị ime, nwaanyị ga-amụ nwa, nwaanyị ga-azụ nwa. Nwaanyị ga-esi nri, dozie ezinaụlọ, nwaanyị ga-akpatakwa ihe a ga-eri n’ezinaụlọ. Hee! ụwa ụmụnwaanyị! Ebe nwaanyị mere ihe ndị a niile, ọ gịnị bụzi ọlụ ụmụnwoke?
Ọtụtụ ego ụmụnwaanyị na-akpata n’ezinaụlọ bụ naanị iji rie nri na igbo obere mkpa dị iche iche, ma ọ bụ ego nwoke ka e ji alụ ọlụ siri ike dịka ịgba ala, ịlụ ụlọ obibi, ịlụ ụlọ ebe nlụpụta ngwa ahịa, wdg. O nwere ebe Chi kere nwaanyị ọ ga-ejedebe ma mgbe ọbụla ọ gafere ya, ahụ na-agbakasị ya n’ihi na ọ gafeela ebe Chi debere ya ọ ga-ejedebe.
Nke ọzọ bụ ejechaa ọgwụ n’ihe na-eche ụmụnwaanyị aka mgba n’alụm dị bụ mgbe a jụrụ na nke nwoke na nke nwaanyị hụrụ onwe ha n’anya agaghị alụ di na nwunye n’ihi otu okwu e nweghị nghọta sitere n’akụkụ nke nwoke ma ọ bụ nke nwaanyị.
Mgbe ọ bụla e gbochiri mmadụ abụọ ndị a ịlụ di na nwunye, ị ga-ahụ na ọ ga-esiri ha ike inweta onye ya na ha ga-ebinwu. Nwoke ọ bụla nwere nwaanyị bụ nwunye ya ebe nwaanyị ọ bụla nwekwara nwoke bụ di ya. Site n’okike ụwa, e kere ha abụọ abụọ, oke na nwunye. Onye kacha nwe Chi ọjọọ n’ụwa ya bụ nwoke lụrụ nwaanyị abụghị nwunye ya ma ọ bụ nwaanyị lụrụ nwoke abụghị di ya.
Kedụ ụdị ezinaụlọ mmadụ abụọ ahụghị onwe ha n’anya ga-ewube? Ihụnanya bụ ihe mbụ a chọrọ n’alum di na nwunye, ndị ọzọ ewee na-eso. Mgbe ọ bụla mmiri siri n’akụkụ dị otu a gbarụọ, ị mara na aha ọzọ a ga-akpọ alụm di na nwunye ahụ bụ ‘chizoba’ n’ihi na ọ ga-ahịa ahụ inweta ihe a tụrụ anya n’aka ha. Ka ọ dị izuụka ọzọ.