A KPỌKUOLA ma dụọ ndị ahụ ji ótù ahọ efe ala nna anyị ka ha gbaa mbọ mụta asụsụ ndị obodo dị iche iche ha nọ were ejere ala nna ha ozi.
Ọ bụ onye enyemaka pụrụ iche nyéré nye onyeisi nlekọta ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka ndị ahụ ji ótù ahọ efe ala nna anyị na steeti Delta, bụ maazị Chuks Odega kpọrọ oku a na nkuzi o nyèrè ndị ahụ n’ogige ụlọ ikwuu ha dị n’Issele-Uku, n’okpuru ọchịchị Anịọcha North nke steeti ahụ.
O mere ka a mara na mmadụ ịghọta, ịma asụ na ịma ede asụsụ ndị obodo e zigara ya dị óké mkpà, maka na NNE ahụ ga-enyere onye ahụ aka n’ụzọ pụrụ iche ịkwàlite ịdị n’otu na mmekọrịta ya na ndị obodo ahụ, ọ kachasị ndị e zigara n’ime-ime obodo.
Ya bụ ezi nwaafọ Anịọma gara n’ihu kụziere ndị ahụ ụfọdụ ihe dị oke mkpà na ha ga-ama n’asụsụ Igbo, nke gụnyere otuṅe si ekele ekele, ihe a na-akpọ okwu Igbo dị iche-iche, ọnụ ọgụgụ Igbo na ihe ndị ọzọ, ma kpọkuo ha ka ha wère òhèrè ahụ ha nwèrè ịbụ ndị e zitere na steeti ahụ ífè ala nna ha wee mụta asụsụ ha n’ihi úrù na ihuọma dị iche-iche, nke ahụ pụrụ iwètàrà ha.
Ọ gakwara n’ihu metụsịa aka n’ụfọdụ omenala obodo dị iche iche na steeti ahụ, ọ kachasị dịka o siri metụta ịlụ nwaanyị, ịwa ọjị, ejiji, nri na ihe ndị ọzọ ha na-emegasị dịka omenala na ọdịnala ha, ma dọkwa ha aka na ntị ka onye ọbụla n’ime gharakwa ịnwà ànwà tinye aka n’ihe ọbụla ga-emebìri ndị obodo na-ele ha ọbịa omenala ha, n’ihi ọtụtụ ihe ga-esochi ya azụ, maka na ọkwa mba na-achị n’olu n’olu.