GỌỌMENTI steeti Anambra àmàlitela ikpochasị na ịkọchàsị ọwà mmiri dịgasị na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ, iji mee ka mmiri na-agara onwe ya sírírí-wèrèrè, ọ kachasị ugbua a banyègòrò n’ụmị udu mmiri kpọmkwèm.
N’okwu ya oge ọ gara ileta ka ọrụ sì aga mgbe a na-akọchasị ma na-ekpochasị ọwa mmiri dị na mpaghara okporo ụzọ Nise -Amawbia – Nibo, kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, bụ maazị Marcel Ifejiọfọr kwùrù na nke ahụ dabàrà adabà na ntuziaka nke aka na-achị steeti ahụ bụ gọvanọ Willie Obianọ nyèrè na ezi mbọ ya ịhụ na steeti ahụ bụ eji ama àtụ.
O mere ka a mara na e wezùga na nke ahụ ga-enye aka n’ịsụghèsì ọwà mmiri sụchiri àsụchi iji mee ka mmiri na-agara onwe ya otu o kwesìrì; ọ ga-enyekwara ndị mmadụ aka ịma ókè ebe ụzọ jedobere, iji gbanahị ọdachi ma ọ bụ ụdị ihe mberede okporo ụzọ
ahụ mere n’ahọ gara aga, ebe mgbe idè mmiri gbàgbùrù otu nwata nwaanyị. Ọ kpọkurù ndị bi na mpaghara ahụ ka ha gaa n’ihu ịkwadò ndị na-arụ ya bụ ọrụ ma nyekwa ha ndụmọdụ ka onye ọbụla n’ime ha ghara ịgbaghàchì aka elekere na ya bụ ezi ọrụ.
O jizịkwa òhèrè ahụ wee kpọkuo ma dụọ ndị na-eji ahịhịa asụchisi ọwà mmiri nakwa ndị na-arụkwàsa ụlọ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ n’ọwara ebe ídè mmiri si aga, ka ha sepù aka n’ime ihe dị otu ahụ, n’ihi ajọ ọnọdụ ọ na-ewèta na gbùrùgbúrù, ọbụnadị dịka ọ dọrọ ha aka na ntị na onye ọbụla e jidere ka ọ na-eme nke ahụ, ga-abụ onye a ga-akpụpụ ụlọ ikpe, ma were usoro iwu gwọọ ya aṅàbaṅàchà.
Na ntụnye nke ya, onye na-elekọta ya bụ ọrụ ngo, bụ maazị Jacob Inaine kwùrù na a na-atụ anya na a ga-enwe oke iju mmiri n’ime ahọ a, kwe nkwà na ya ga-arụ ya bụ ọrụ n’ụzọ a tụrụ anya, ma kwukwazie na ọ ga-akụrụ ọnụ n’ime ọnwa Ọgọstụ na-abịa abịa.