September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Asụsụ, omenala Igbo agaghị anwụ – Onyeisi ASUBEB

Ugbaja

Iji gosipụta mbọ gọọmentị na-agba iji hụ na asụsụ na omenala Igbo alaghị azụ n’ebe ụmụ na-eto eto nọ, Ka Ọ Dị Taa gbara onyeisioche ụlọọlụ ‘Anambra State Universal Basic Education Board’ (ASUBEB) bụ Patrick Ugbaja ajụjụ ọnụ n’isi ụlọọlụ ya. Otu a ka o siri gaa:

 

OLEE ihe Ị ga-agwa anyị maka asụsụ na omenala Igbo?

Asusụ na omenala Igbo bụ njirimara Igbo. Ọ bụ asụsụ  na omenala ka e ji ama ebe onye si na ihe ndị be ha na-eme. Ọ na-egosipụtakwa nkwenye na okpukperechi.

Dịka Ị maara na asụsụ na omenala na-esi n’aka fere aka wee na-aga nke mere na o si n’aka ndị nna nna anyị wee ruo anyị aka; olee mbọ ụlọọlụ a na-agba iji hụ na a kụnyere ya bụ mkpụrụ n’ime ụmụaka na-eto eto n’ime ụlọakwụkwọ?

Anyị nwere ndị nkuzi n’ụlọakwụkwọ anyị dị iche iche bụ ndị na-akụzi asụsụ na omenala Igbo. Anyị na-akpachapụ anya wee na-ewe ha n’ihi na anyị maara na ọ bụ ihe dị mkpa.

N’ime ụlọọlụ a, anyị nwere ọnọdụ maka onye na-ahụ maka asụsụ na omenala Igbo, onye na-agarubekwa okirikiri niile iji hụ na ọ na-aga n’ihu. Anyị na ndị dị iche iche na-ahụ maka asụsụ na omenala Igbo na-alụkọkwa ọlu ọnụ. N’izuụka gara aga, otu a kpọrọ Igbo Anụgo bịakwutere anyị n’isi ụlọọlụ a, anyị kwadoro ha nkeọma ịga lee ụmụakwụkwọ anyị asọmpi ajụjụ ọnụ (quiz competition) site n’okpuru ọchịchị (Local Government Area) dị iche iche, ruo na zoonu wee pịachizie ya n’ikpeazụ n’isi ụlọọlụ anyị ebe a (headquarter).

A pịachiri ya nkeọma ebe a nọ nyesịa ụmụakwụkwọ ndị nwetara mmeri onyinye dị iche iche. Ya mere, anyị na-akwado ndị niile na-akụzị ma na-akwalite asụsụ na omenala Igbo.

Dịka anyị maara na aka na-achị steeti a bụ Anambra, Gọvanọ Willie Obiano (Akpokuedike) wepụtara ụbọchị Wenezdee n’izuụka ọ bụla ka ọ bụrụ ụbọchị e ji eyi akwa ma na-eke ekike njirimara ndị Igbo; olee ihe ị nwere ike ikwu maka nke a?

Nke a bụ ihe dị ọkpụtọrọkpụ kemgbe gọvanọ anyị bụ Obiano malitere ọlụ. I lee anya, ụlọakwụkwọ na-akwazi akwa njirimara ndị Igbo. N’ụlọọlụ a, ndị eyighị ya a na-achụchigha ha azụ. Otu a ka ọ dị, site n’isi ruo n’ụlọakwụkwọ dị iche iche.

Ka ọ dị ugbu a, anyị na-akwado ịhazị nnukwu emume iji gosipụta asụsụ na omenala Igbo (cultural festival). A ga-eme ya n’ọkọchị a na-abịanụ. Anyị ga-ezikwa gọvanọ anyị bụ Willie Obiano ka ọ bịa. Ụmụaka ga-anọ na ya gosipụta ihe ha mụtara maka asụsụ na omenala Igbo.

Olee uru dị n’ịkwalite asụsụ na omenala Igbo?

Ị jụrụ m na mbụ sị na o si n’aka nna nna anyị wee ruo anyị aka, ya mere otu a ka ọ dị. Anyị ga-ahafe ya n’aka ha ka ha wee nwee ike hafekwaa ya n’aka ndị ọzọ, ka o wee hapụ ịnwụ. Anyị achọghị ka asụsụ na omenala Igbo nwụọ. Anyị na-anụ ka a na-ekwu na asụsụ na omenala Igbo ga-anwụ, anyị achọghị ya.

%d bloggers like this: