September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

COZA: Onweghi onye ga-anọchi anya di m ọma – Nwunye Fatoyinbo

NWUNYE onyeisiụka ‘Commonwealth of Zion Assembly’ (COZA) e kwuola na onweghi onye ga-anọchi anya di ya n’ụlọụka ahụ. O kwukwara na ya agaghị ahapụ di ya.

O kwuru nke a mgbe di ya bụ Biodun Fatoyinbo mara ọkwa n’ụbọchi monde gara aga na ọ ga- akwụsịtu dika onyeisi ụlọụka ahụ maka ebubo e boro ya na ọ wakporo otu nwaanyi aha ya bụ Busola, nwunye Timi Dakolo nke e ji ịgu egwu wee mara.

Busula boro onyeisi ụlọụka ahụ ebubo na ọ kwasoro ya iko n’ike ugboro abụọ n’izuụka abụọ n’oge tere aka ihe dịka afọ iri abụọ gara aga.

Ya bụ onyeisi ụlọụka e boro ebubo kwuru na aka ya di ọcha n’ihe ọjoọ a siri na o mere, ma kwuo na ya ga-ewega okwu ahụ n’ụlọikpe.

Okwu ahụ butere ngagharị iwe, ebe ọtụtụ ndi mmadu nukọọrọ gaa n’ụlọụka ahụ dị na Lagos na Abuja.

Ya bụ ọkwu akpalitela ndị mmadụ ikwupụta ebumnuche ha gbasara ọnọdụ ahụ.

%d bloggers like this: