GỌỌMENTI steeti Anambra anarala ma kpọrọ nwa ọhụrụ nwa ọhụụ gbara naanị mkpụrụ ụbọchị atọ, bụ onye a gbahàpụrụ n’ọwà mmiri nso-nso na steeti ahụ.
Nwata nwoke ahụ bụ onye e kwuru na a fọnyèrè ya n’ime àkpà ojii, wee dọnye ya n’ọwà mmiiri dị na mpaghara ụlọakwụkwọ “Girls Secondary School” dị n’Amaenyi, n’okpuru ọchịchị Awka South, wee ruo mgbe ụmụaka na-aga mkpa ejùla hụrụ ya n’ihe dịka elekere iri nke anyasị.
Dịka akụkọ siri kọọ, mgbe ha hụrụ nke a, ha wee gbapụ ga kpọọ nwanne ha nwaanyị nke tọrọ, bụ onye bịara ozigbo, wee buru ya bụ nwatà gaba n’ụlọ ọgwụ ozigbo ka e wee leruo ya anya, tupuu e nyefèzie ya n’aka gọọmenti okpuru ọchịchị ahụ.
Ka ọ dị taa, a hafèéla ya bụ nwata n’aka gọọmenti steeti Anambra n’okpuru isi ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka ọdịmma, ihe metụtara ụmụ ntàkịrị na ndị nne.
N’okwu ya oge ọ na-ahafè nwata ahụ n’aka ụlọ ọrụ ahụ, mmemme ahụ, onyeisi oche nchere oge n’okpuru ọchịchị Awka South, bụ maazị Leo Nwụba mere ka a mara na ha kpebìrì ime nke ahụ, iji wee hụ na e lèrùrù ya anya nke ọma ma zụlitekwa ya n’ụzọ ziri ezi, n’ihi na o nwèrè olileanya na site n’ezi nlekọta nke nwunyè aka na-achị steeti ahụ, bụ oriakụ Ebelechukwu Obianọ ga-enye ya bụ nwata, na ọ ga-abụ oke mmadụ na ndụ ya, ma bụrụkwa onye a ga-eji na-ama aṅàtụ na steeti ahụ.
Dịka ọ na-akọwa nwa dịka onyinye si n’aka Chineke, maazị Chinwụba gara n’ihu kelee Chineke maka nchekwaba na ndụ o nyèrè nwata ahụ aka ya dị ọcha, na-agbanyeghị ebe o nwètara onwe ya, ma kpee ka ndụ, ahụ ike na ọganihu na-awara ya ọjị ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya, ọbụnadị dịka o kelere ndị nyere aka n’ịzọpụta ya.
Na nkọwa ya, ótu onye n’ime ndị ahụ zọpụtara nwa ọhụụ ahụ, bụ nwaada Onyekachi Eze mere ka a mara na oge ụmụnne ya hụrụ ya ka ọ na-emegharị ahụ n’ime akpa n’anyasị ahụ, na ha chèrè na ọ bụ nkịta, wee ruzie oge ha gara nso wee nyòó anya, chọpụta na ọ bụ nwa ọhụụ. O kwùkwàrà na ọbara dịgasị nwata ahụ n’ahụ mgbe ha hụrụ ya, ha wee buru ya gaba ụlọ ọgwụ, ma gakwa n’ogige ndị uwe ojii ga nye mkpesa.
O kelezịrị Chineke otu o siri me ka ihe niile gaa nke ọma, ma rịọzie ka Ọ gọzie nwatà ahụ na akaraka ya.