OTU nwata nwoke gbara afọ iri na isii amụnyela nne ya ochie ọkụ n’Amudo Awka, nke dị n’okpuru ọchịchị Awka ‘South’ na steeti Anambra, n’ụtụtụ satọdee gara aga.
Otu onye bi n’agbataobi ahụ ma bụrụ onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara ndị nta akụkọ na nwaanyị ahụ aha ya bụ Vero Okwuọgụ ka nwa nwa ya kere ụdọ, wụọ ya mmanụ ọkụ kerozin, wee mụnye ya ọkụ, ọ gbagbuo ya, ọ nwụọ.
Mgbe nke ahụ na-eme ka e kwuru na nwata nwoke ahụ yiri ụmụnne ya nwoke abụọ nọ ebe ahụ egwu na ọ bụru na ha mee mkpọtụ, ya atụnyekwuo ha n’ọkụ.
Dịka akụkọ siri kwu,nwata nwoke ahụ nọ na sinịọ sekọndịrị ebe nne ya ochie bụ onye ọkaikpe.Ka ọ dị ugbua,nna nwata ahụ ma bụrụ nwa nwaanyị ahụ lara mmụọ adọnyela nne ya n’ọba ozu.
Onye uweojii na-ahụ maka ọdị mma ndị mmadụ na ndị uweojii na steeti Anambra bụ Harụna Mohammed kwuru na ya bụ ihe mere n’eziokwu ma kwukwaa na a na-emezi nnyocha banyere ya ugbu a.