E KWURU na ihunanya bụ ihe mbụ a chọrọ n’alụm di na nwunye, ihe ndị ọzọ ewee na-eso. Ma ugbu a, oke ịchụ akụ na ụba bụ ihe mbụ, ndị ọzọ ewee na-eso, n’ihi na ọtụtụ ụmụnwoke na nwunye ha ebighị n’ihi ịchụ akụ na ụba. Ọtụtụ ụmụntakịrị amaghị onye bụ nna ha, ụfọdụ na-ahụ nna ha otu ugboro n’afọ. Amaghịzi ka mmadụ abụọ ndị a si enyere onwe ha aka na- akasirịta onwe ha obi n’ọnọdụ e jiri wube ezinaụlọ. Ọ na-emekwa ọtụtụ n’ime ha ịgba n’ezi.
Ọtụtụ ụmụnwoke jizi obi ọjọọ eso nwunye ha n’ihi oke ịchụ akụ na ụba ọ kachasi mgbe ha achụtaghị ya, ọ dịzie ka ọ bụ nwaanyị mere ihe ji sie ike. Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-emekwazi ihe ha ekwesighị ime ka ha wee hụ ego ha ji eleta ụmụ ha n’ihi na ihe jikọrọ nne na nwa dị egwu.
Oke ịchụ akụ na ụba so n’otu nnukwu ihe mere alụm di na nwunye ma ọ bụ ezinaụlọ jiri gbarụọ ka mmiri, na-ada ka ụlọ ejighị okwute na igwe lụọ n’ihi na a hapụziri ụzọ, sizie ọhịa.
Ọ bụrụ na i lee anya n’ihe a dị iche iche a kpọpụtara; kedụ ka i siri chee na alum di na nwunye ga-eguzo ebe ihe e jiri wube ya adịghịzị? Ezinaụlọ ahụ ga-ama afọ n’ala n’ihi na ọ ga-enwe oke tigbue zogbuo ebe ihe a chọrọ n’aka ha ka ezinaụlọ wee guzọ adịghị.
Ọ ga-adị nnọọ mma na e lebaa anya n’ihe a dị iche iche na-eche aka mgba n’alum di na nwunye n’ihi na ọtụtụ ụmụnwaanyị chịzi uche n’aka nke na ọtụtụ enweghịzị mmasị ma na-atụ egwu ịba n’alum di n’ihi ihe ha hụrụ ndị nọ na ya na-agabiga.
E kwuru sị na “O si taa dị mma ọ dibara gboo.” Alum di na nwunye ga-eguzonwu ọzọ ma tọkwaa ụtọ ma ọ bụrụ na a ga-eleba anya n’ihe a dị iche iche na-eche aka mgba na ya. Ezinaụlọ so n’ihe mbụ mara ezigbo mma Chukwu kere ụwa kere a ga-asọpụrụ n’ihi na onye buru chi ya ụzọ, ọ gbagbue onwe ya n’ọsọ. Ka-emesia.