NNEKWU kpọrọ ụmụanụmanụ oku nzukọ mberede. N’ime ya bụ nzukọ ka nnekwu gwara ụmụanụmanụ na ezuola ego ahụ niile ha tụkọtara na nzukọ nke ọ na-edebere ha.
Nnukwu nsogbu na ọgbaghara wee daa n’etiti ụmụanụmanụ,ha niile wee bee n’ụdị dị iche iche chi siri kee ha n’ize iwe. Ọtụtụ n’ime ụmụanụmanụ ahụ kwara arịrị n’ihi na ha edebechaala ihe ha ga-eji ego ahụ mee.
Ewu sịrị na ya akwadochaala otu ọ ga-esi were ego ahụ kụọ elu ụlọ ya ọ lụchabeghị. Nkita kwuru na ọ ga-eji nke ya bukọta ọkpụkpụ maka ya na ezinaụlọ ya.
Mbe ǹụrụ iyi na ya enweghị ike ịhapụ oke nke ya n’ego ahụ, ụmụanụmanụ niile wee na-ewere nnekwu iwe ma ǹụọ iyi na ha agaghị ahapụ ego ahụ.
Nnekwu wee bilie gwa ụmụanụmanụ na ha mara otu ọ bụla ha ga-esi chọ ego ahụ, ha chọọ. Mbe ghasara atụmatụ ahụ n’ihi na ọ matara n’aka ga-akpara ya ma ọ bụrụ na ụmụanụmanụ gaa ịchọ ego ahụ.
N’ikpeazụ ụmụanụmanụ kwuru na ha amaghị ihe ọ bụla gbasara ebe nnekwu debere ego ahụ na ihe ọ na-ekwu. Ha kwukwara na ha adịghị njikere ịchọ ego ahụ n’ụdị ọ bụla na iwu bụ na nnekwu na ezinaụlọ ya ga-ewetarịrị ha ego ha.
Nnekwu na ezinaụlọ ya wee laa n’ụlọ ha ịchọ ego ụmụanụmanụ nyere ya ka ọ debere ha. Rue ụbọchị taa ọkụkọ ka ji ụkwụ ya na-abọ ala n’olile anya na ọ ga-ahụ ego ahụ ụmụanụmanụ nyere ya ka o debere ha. Chakpii!