September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Igbochi alụkwaghịm n’etiti di na nwunye

OKE alụkwaghị m di ugbu a bụ ihe na-agba anya mmiri. Alụkwaghi m a so n’ihe wetara ọtụtụ nsogbu dị n’ụwa taa. Ọnọdụ a mere na nne na nna mụrụ ụmụ adịghị anọkọzi ọnụ enye ụmụ ha ọzụzụ dịka o kwesiri.

N’agbanyeghị na nne na nna adịzịghị achọtara ụmụ ha onye ha ga-alụ ma ọ bụ onye ga-alụ ha ugbu a, nsogbu alukwaghịm karịrị otu o dị na mbụ. N’oge a, nwa okorobia na nwagboghọbia na-ahụ onwe ha,bido na-eme enyi, biri n’otu ụlọ na-anagide onwe ha,

ọdịghị onye ọbụla n’ime ha na-ahụ agwa ọjọọ ibe ya na-akpa mana ha abụọ kpebie ibikọ dịka di na nwunye, nsogbu e si n’elu si n’ala pụta nke na-eme na ha abụọ agaghị enwe ike ibikọ n’otu ụlọ ọzọ.Ọ bụrụ na mmadụ abụọ ga-ebikọ ọnụ dịka enyi, ha agaghị enwe nsogbu,okwesiri ka ha abụọ biri dịka di na nwunye n’ enweghị nsogbu maka na ha amarala onwe ha.

Igba alụkwaghi m na-eweta ọtụtụ nsogbu n’ezinaụlọ ọ kachasi ebe amụgoro ụmụ were gbawa alụkwaghịm.

Otu onye ụkọchukwu aha ya bụ Daniel Egeonu, bụ onye nke na-eje ozi ya n’ụlọụka ‘Christ Ascension Church, Ifite Awka,’ zara ajụjụ ole na ole ajụrụ ya gbasara otu a ga-esi gbochie alukwaghị m di ugbu a.

Ọ siri na nke mbụ bụ na ọ bụ amaghị okwu onye hibere alum di na nwunye mere ndị na-alụ di na nwunye ji agba alụkwaghị m. Ọ siri na ọ dị ọtụtụ ihe nke na-eweta igba alukwaghịm; nke mbụ oke amamihe dị ugbu a. Nke abụọ bụ enweghị ndidi, nke atọ enweghị ihere, nke anọ enyeghị okwu Chineke ohere na ndụ mmadụ nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

“ N’ihi oke amamihe na oke agụmakwụkwọ nwaanyị enweghịzị ike inọ n’ okpuru nwoke. Oke amamihe a mere na nwoke adịghịzị ama ihe kwesịrị ya ime ka onwee ugwu na nsọpụrụ kwesiri ya n’ezinaụlọ ya. Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụrụ na nwoke mara onwe ya na nwaanyị ọ na-alụ agaghị na- eme otu o siri masị ya bụ nke na-eweta alụkwaghị m n’ụfọdụ ezinaụlọ.

Oge gboo,mgbe oke amamihe na oke achụmego adịghị, nwaanyị na-anọ n’okpuru nwoke na-erubere ya isi,ma ugbu a, n’ihi na nwoke na-alụ ọlu nwaanyị na-alụ ọlụ na-ewebata ego n’ezinaụlọ, ha abụọ na-ahụzị onwe ha ka ndị ha nhaanya.Obere okwu pụta, ọdịghị onye ga-achọ ka ọ dịka ọ maghị ihe, nkewa ewee dị.

“Oge ụfọdụ, ọbụrụ nwaanyị na-akpata ego e ji egbo mkpa n’ezinaụlọ nwoke enweghị ihe ọ na-arụ, ọbụrụkwa na nwoke ahụ enweghị obi ume ala, udo agaghị adị”.

Onye ụkọchukwu a sịrị na ụzọ a ga-esi gbochie oke alụkwaghị m a bụ ndị lugoro di na nwunye ma ndị ka na-achọ ịlụ na-akpali mmụọ nke ihunanya n’etiti onwe ha. Ọzọkwa, ka ha mee ka okwu Chukwu a gwara ha ụbọchị ha gbara akwụkwọ na-akụ ka ekwe n’obi ha.

Ọ sịrị na dị na nwunye ọbụla maara okwu Chineke agaghị agbasa ma nsogbu pụta, na ha ga ewere mmụọ dị nwayọọ wee gboo nsogbu ahụ  maka na mgbe mmadụ abụọ mụrụ ụmụ gbasara ha adịghị eme ebumnobi Chukwu jiri jikọ ha abụọ ọnụ dịka di na nwunye.

Okwesịrị ka onye ọbụla gbaa mbọ ịgbochi alukwaghị m n’ihi ọtụtụ nsogbu ọ na-ewetara ụmụaka.

%d bloggers like this: