NDỊ ‘St Anthony’s Catholic Church’, Ifite Awka nke dị n’okpuru ọchịchị Awka ‘South’ na steeti Anambra nọ na nwa mgbe gara aga mee emume icheta ụbọchị onye dị asọ ha na-aza aha ya.
E ji aja maasị malite ya nke onye ode akwụkwọ nye bishọọp ụka Katọlik n’Awka dayọsis bụ Fada Michael Muonwe bịara nọchite anya ya bụ bishọọp bụ Most Rev Paulinus Ezeokafor.Fada Muonwe gwara ha na bishọọp sịrị ha jide ka ha ji n’ihi na ọ maara mbọ niile ha na-agba.
N’okwuchukwu ya, Fada Muonwe kpọkuru ndị ụka ka ha gbanwee ndụ ochie ha ma soro ndụ ọhụrụ.Ọ rụtụrụ aka n’ihe ọgụgụ nke mbụ nke e wetara n’akwụkwọ mbụ nke ndị eze nke bụ otu Chukwu siri gwa Elijah ka ọ kpọọ Elisha. O kwuru sị, “Chukwu bidoro na-akpọ anyị kemgbe a mụrụ anyị. Ụfọdụ nabatara oku a site n’iso Chineke, ebe ụfọdụ jụrụ ya site n’iso ekwensu.”
Ọ gara n’ihu gwa ndị mmadụ ka ha ǹomie ndụ Anthony dị asọ n’ihi na o kwesịrị ntụkwasiobi.
N’akụkụ nke ya, ụkọchukwu parish ‘St Anthony’ bụ Fada Columba Okany kelere Bishọp Ezeokafor maka ifunanya ya, tinyere Fada Muonwe onye nọrọ n’isi aja maasị na Fada Anthony Ezeokeke bụ osote chanselọ nke dayọsis maka isonye chụọ aja maasị. O kelewara mmadụ niile.
Onyeisioche mmemme ahụ bụ Ọkammụta Makodi Biereenu-Nnabugwu nyere obere nkọwa maka Anthony dị asọ n’okwu mmalite ya mgbe a gbasara ụka. O kwuru sị na ọ bụ ma ọnwa Juun dị n’abali iri na atọ ka e ji echeta ya afọ ọbụla (feastday).
Ndị kansụl na-ahụ maka ụlọụka ahụ n’ozi nnabata ha kọwapụtara mkpa ha nke bụ inweta ebe a na-aga mposi ụdị ọgbara ọhụrụ, tinyekwara mmiri nke na-akọ ha.
Site n’amara Chineke, ndị mmadụ zara ha oku ma kwado ha ka e wee lụpụta ya bụ ihe bụ mkpa ha n’ihi na ndị mmadụ sị n’ugwu na ndịda wee bia mmemme ahụ.
E mere ọtụtụ ihe ngosi dị iche iche nke gụnyere ejije, ịwa achịcha w.d.g.
E wetara ya bụ nnukwu mmemme n’isi njedebe site n’ekpere na ngozi nke si n’aka osote ụkọchukwu parish ahụ bụ Fada Augustine Nwatuegwu.