September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Oke ọǹụ dara ka nwunye Ekwueme gbara afọ iri asatọ na ise

Oriakụ Ekwueme

OKE ọǹụ dara n’Enugu ka Dame Beatrice Chigozili Ekwueme bụ nwunye Dọkịnta Alex Ekwueme, onye jibu ọkwa dịka osote onye isi ala Nigeria mere emume icheta ọgbụgba iri afọ asatọ n’ise.

Emume a dara ụda na ‘Cathedral of the Good Shepherd, Enugu’, ebe Archbishop ụka Anglikan dayọsis Enugu bụ Most Rev Emmanuel Chukwuma nọ n’isi emume ofufe nru. Ọ kpọkuru ndị na-eso ụzọ Kraist ka ha na-ekele Chineke oge niile maka ndụ na ahụike.

Site n’isiokwu nke e wetere n’akwụkwọ abụọma, isi nke otu narị na atọ “Inye Chineke ekene”, Most Rev Chukwuma kwuru na mmadụ na-enweta ngozi na ihunanya dị iche iche n’aka Chineke ụbọchị ọ bụla nke na mgbe ụfọdụ anyị anaghị etozu etozu ịnata n’aka ya.

Ya mere, ọ gwara ndị otu Kraist ka ha na-ebi ezi ndụ ma gbaara njọ ọsọ nke na-egbochi mmadụ ịnata amara Chineke.

Chukwuma kpọkukwara ‘President’ Muhammadu Buhari na ndị gọvanọ na-achị na steeti niile ka ha gbaa mbọ iji kwalite ezi nchekwa n’ala anyị.

Ọ kọwara Dame Ekwueme dịka onye biri ndụ ndidi na ihụnanya n’ebe ndị mmadụ nọ, ma bụrụ ezigbo onye nne.

Aka na-achị steeti Enugu bụ Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi kelere Chineke maka ndụ na ahụike n’ebe Dame Beatrice Ekwueme nọ. Ọ kọwara ya dịka onye ndụ ya kwesịrị ǹǹomi.

Ndị ọzọ bịara nnukwu mmemme ahụ gụnyere Peter Obi, Emmanuel Iwuanyanwu, Jim Nwobodo, Okwesilieze Nwodo, Laz Ekwueme (nwanne Ekwueme lara mmụọ ma bụrụ Igwe na-achị Oko na steeti Anambra) na ọtụtụ ndị ọzọ.

%d bloggers like this: