OTU nwoke aha ya bụ Musa onye ya na Fatima bụ nwunye mmadụ na-eme enyi ka mmiri tabidoro ebe ha na-akwa iko.
Akụkọ kọrọ na ka ha abụọ nọ n’ime ụlọ na-akwa iko ka ha chọpụtara na ha enweghịzị ike ikewapụ onwe ha. Nke a pụtara na ha tọkịịrị n’amaghịzị ihe ha ga-eme, ka a na-ekwu, ha bidoro na-enwe ihe mgbu dị egwu.
Ọ bụ na steeti Nasarawa ka nke a nọ wee mee. Di nwaanyị ahụ aha ya bụ Yakubu gwara ndị nta akụkọ na o teela aka ya ji agwa nwunye ya ka ọ hapụ ịgba n’ezi ma na-adọkwa Musa aka na nti ka ọ hapụrụ ya nwunye ya, onye ya na ya lụrụ di na nwunye kemgbe 2009, ma ha abụọ achọghị ịnụ arịrịọ ya.
Yakubu kwuru na ya edikatara ya bụ ihe o kweghịzi ya odidi. Ọ gwara nne na nna nwunye ya ma ha ekwetaghị. Na ọ bụ ya mere ya jiri gaa ala Yoruba gwọta ọgwụ nke dibia nyere ya ka o tinye n’ọbante nwunye ya.
Ya mere, ka ọ gawakwara njem azụmahịa dịka o si eje, nwunye ya pụrụ gakwuru enyi ya nwoke Musa, ka o si eje na mbụ. Ọ bụ ụbọchị ahụ ka iko ha juru.
Mgbe ha nọkatara n’elu akwa n’ihe mgbu, ha bidoro suba ude ruo chi ọbụbọ nke mere ka ndị agbataobi gbawaa ụzọ wee buru ha gawa ụlọọgwụ. Ọ bụ n’ụlọọgwụ ka a nọ kewaa ha abụọ (surgery). Ka ọ dị ugbua, ha nọzị n’ụlọọgwụ na-anara ọgwụ maka ịgbasi ike.
Otu o sila dị, otu onye ọlụ ahụike n’ụlọọgwụ ahụ kwuru na ya ekwetaghị na ọ bụ ọgwụ a gwọrọ agwọ mere ya bụ ihe, kama o kwuru na ụdị ihe dị otu ahụ na-adapụta mgbe ụfọdụ na mmekọ nwoke na nwaanyị.