ỤBỌCHỊ Mọnde izuụka a, ka mahadum University of Nigeria, Nsukka (UNN), gosipụtara ụgbọala latrik (electric car) izizi a rụpụtara n’obodo Nigeria. Ọ bụ ndị ngalaba Faculty of Engineering nke mahadum ahụ mepụtara ya.
Ka a nọ na mmemme ahụ, onyeisi (Director General) nke National Automotive Design and Development Council (NADDC), Aliyu Jelani bụ onye nke onyeisi ngalaba na-ahụ maka mgbakọ na mwepụ (Finance and Account) n’ụlọọlụ ahụ David Oyetunji nọchitere anya ya toro UNN maka ibụ ndị mbụ rụpụtara ụgbọala latrik n’ala anyị.
Ụgbọala ahụ nke a kpọrọ ‘Lion Ozumba 551’ bụ atụmatụ nke onye jibu ọkwa dịka onyeisi ụlọakwụkwọ UNN bụ Ọkammụta Benjamin Ozumba tụpụtara.
Aliyu kpọkuru mahadum ndị ọzọ dị n’ala Nigeria ka ha soro nzọụkwụ UNN wee lebaa anya n’ihe gbasara imepụta ihe (innovations and technology) iji wee kwalite akụ na ụba ala anyị.
Ọ kọwara sị na NADDC kpọrọ ụfọdụ mahadum oku n’ọnwa Febuari maka ịrụpụta ụgbọala latrik n’ala anyị. Na ha nwere aǹụrị na UNN abụrụla ndị mbụ rụpụtara ya bụ ụgbọala bụ nke e gosipụtarala ma nwalee.
Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Ọkammụta Charles Igwe, kwuru na ọchịchị ya ga na-aga n’ihu n’ikwado ọlụ (innovation and technology) iji kwalite mahadum ahụ n’ogo dị elu.
Igwe toro onyeisi ụlọakwụkwọ bunyere ya oche, bụ Ozumba onye nke o kwuru na ọ bụ ya kụrụ mkpụrụ, ma sitekwa na mbọ ya mee ka UNN bụrụ mahadum mbụ na Nigeria.
N’akụkụ nke ya Ọkammụta Ozumba kwuru na ọǹụ juru ya obi oge a kporo ya maka ngosipụta ụgbọala latrik ahụ.