A HỌPỤTALA otu nwaanyị onye Nigeria, Kemi Badenotch dịka minista na mba United Kingdom. Ọ ga-esonyezi na ndị ọchịchị (cabinet) nke onye ọchịchị ‘Prime Minister’ a họpụtara ọhụrụ bụ Boris Johnson.
A mụrụ Oriakụ Badenotch, onye nke bụbụ Kemi Olufunto Adegoke n’ọnwa Jenụwarị n’afọ 1980 na Wimbledion UK.
Ọ biri na Lagos na America mgbe ọ dị na nwata ma mechaa laghachi UK mgbe ọ dị afọ iri na isii. Onye Anglo-Irish bụ Hamish Badenotch lụrụ ya dịka nwunye ya n’afọ 2012.
Banyere nhọpụta ahụ, o kwuru sị “Obi dị m ụtọ banyere nhọpụta a nke ga-enyere m aka ịtụnye ụtụ nke m ka ihe wee dị mma.” Ọ gara n’ihu kwuo na ya ga-agba mbọ rụọ ọrụ nkeọma n’akpaghị oke.