N’ỊGA n’ihu ịhụ na e nwere ezi ọnọdụ gbùrùgburu bụ ịgbà na steeti Anambra, gọọmenti steeti ahụ amalitela ịkọchàsị na ịsụghèsì ọwà mmiri dị iche-iche mere nsụchi na steeti ahụ, site n’okpurù atụmatụ adịmọcha a kpọrọ ‘Dobe Anambra Ọcha’.
Ya bụ ọmarịcha atụmatụ ịkọchasị ọwa mmiri bụ nke ọ bụ isi ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka gbùrùgbúrù nọ n’isi n’imezùpùta ya nakwa itinye ya n’ọrụ, ma bụrụkwa nke ebumnobi ya bụ iji hụ na e bèlàtàrà ma gbòchie mkpamkpa idè mmiri na-akpa n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ na mpaghara ebe ndị ọzọ na ya bụ steeti.
Ya bụ amụmà ọrụ bụ nke weere ọnọdụ na mpaghara ebe dị iche-iche, ma bụrụkwa nke ndị òtù ọrụ ahụ gàghàrịrị n’ọtụtụ ebe n’ihi ya ịhụ na ileta ka o si aga.
N’okwu ya bànyere atụmatụ ahụ, onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ Obianọ n’ihe gbasaara gburugburu, ma bụrụkwa onye onye nlekọta nke atụmatụ ‘Dobe Anambra Ọcha’ na mpaghara ọgbọ nta nkwàdo Anambra Etiti, bụ maazị Francis Igweh kwuru na itinye nke ahụ n’ọrụ bụ iji hụ na ndị Anambra na-esonyesi ike na ya bụ ọmarịcha atụmatụ, ma na-edobekwa gbùrùgburù ha ọcha oge niile dịka o siri kwesi.
Ọ kọwara mkpa ọ dị na onye ọbụla ga na-edobe okirikiri ebe obibi ya, ebe ọ na-azụ ahịa na ebe ọ na-arụ ọrụ ọcha oge niile, n’ihi na nke ahụ agaghị enye aka naanị n’igbòchi ndapụta ma ọ bụ mgbasawanye nke ọrịa na-efe èfè, kama na ọ ga-agakwa n’ihu ime ka mmiri na-agara onwe ya siri-wèrèrè karịa imebìsì okporo ụzọ na ịwa mbize.
Ọ kwàrà àrịrị na Anambra so na steeti kachara pee mpe n’ala Nigeria dịka o siri metụta inwe ụbara ala, ma, n’agbanyeghị nke ahụ, mbize na-emebisi ma na-emekwa mkpamkpa ebe dị iche-iche n’ime steeti ahụ, bụkwa nke o mere ka a mara na ọwà mmiri ime nsụchisi sò n’otù n’ime ihe ndị na-akpata ihe dị otu ahụ.
Ọ kpọkuzịkwàrà ụmụafọ steeti Anambra ka ha na-akọchasị ọwà mmiri ha ma na-edobekwa gburgburu ha ọcha oge niile, iji kwàlite ezigbo adịmọcha na ọnọdụ gburugburu bụ ịgbà, ọbụnadị dịka o o kwùrù na onye ọbụla dara iwu ahụ ma ghara idobe ogige ya ka o siri kwesi ka a ga-anwụchikọ ma kpụpụ ya ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee dobe ya onwe ya ọcha.
Ka ndị ahụ bịara njem ileta ka ya bụ ọrụ si aga n’ahịa ahụ a maara dịka “First Market” dị n’Ifite-Awka; ha hụrụ ndị na-azụ ma na-ere ahịa ebe ahụ ka ha na-akọchasị ọwà mmiri dị ebe ahụ, dịka ha na-esònyèghị otu o si kwesi n’ọrụ mkpocha na nzacha ahụ e mere n’ụbọchị Satọdee ikpeazụ nke ọnwa Julaị gara aga, dịka onyeisi ahịa ahụ bụ maazị Chinedu Nwọgụ siri wee kọwaa n’okwu ọ gwàrà ndị nta akụkọ.
Na ntụnye nke ha n’otu n’otu, otu onye selitere isi na ngalaba ụlọ ọrụ na-ahụ maka gburugburu na steeti ahụ, bụ maazị Oliver Ọzọmena, na otu onye nọchitere anya òtù ọrụ “Operation Clean and Healthy Anambra” nke a maara dịka ỌCHA Brigade, bụ maazị Charles Nwankwọ kwùrù na njem nleta ahụ bụ nke abụọ nke atụmatụ “Dobe Anambra Ọcha”, kpọkuo ụmụafọ Anambra ka ha kwụsị iche ka mmadụ bịa ịchụgharị ha, tupuu ha amalite ikpochasị na idobe gburugburu ha ọcha, maka ọghọm na ihe dị iche iche nke ahụ pụrụ iwètàrà ha na ndị nke ahụ mètụtara.