FADA Cyril Ezeani akọwaala nne ya bụ Oriakụ Felicia Ezeani (nee Oguadi), onye lara mmụọ dịka ọmalịcha nne nwere obi umeala, ma bụrụkwa onye udo. O kelekwara Chineke maka onyinye na ndụ nke ezi nne ya.
Fada Ezeani onye bụ otu n’ime ndị isi ‘directors’ na Fides Communication Okpuno kwupụtara nke a n’ụka elimozi nne ya nke e merubere n’ụlọụka St John the Apostle and Evangelist Catholic Church, Agulu nke dị n’okpuru ọchịchị Anaọcha na steeti Anambra. Ọ bụ nnukwu ụkọchukwu, Most Rev P.C Ezeokafor, bishop ụka katọlik dayọsis nke Awka nọrọ n’isi emume.
N’okwuchukwu, Bishop Ezeokafor kpọkuru ndị ụka ka ha na-eme nke ọma n’ihi na onweghị onye ma mgbe ọ ga-ahapụ ụwa, maka na eligwe bụ ụlọ anyị.
Ọ kọwara Oriakụ Ezeani lara mmụọ dịka nwaanyị nwere nnukwu okwukwe na Chineke, onye di ya nwụrụ afọ iri abụọ na anọ gara aga, mana ọ gbara mbọ zụọ ụmụ ya nkeọma. O kwuru sị, “Keenụ ajị n’ume, ahụhụ na-eme ka mmadụ gbasie ike. Nwaanyị a dị umeala ma gbasie ike, ruo na njedebe.”
Ụkọchukwu Parish ahụ bụ Fada Emmanuel Ezenwata kọwara Oriakụ Ezeani dịka onye na-agba mbọ nke ukwuu n’ụlọụka. O kwuru sị na ọ bụ ya bụ onye mbụ na-abịa ụka ma na-ebidokwa ekpere n’ụka ụzọ ụtụtụ kwa ụbọchị.
Otu onye nne CWO n’ụlọụka ahụ, ma bụrụkwa onye ụmụnna ya bụ Oriakụ Cordelia Ezego, kwuru sị “Nwaanyị a dị ike n’ekpere, ọ dị umeala, ọ zụkwara ụmụ ya nkeọma.”
John Paul Okoye n’aha ndị gụrụ n’ụlọakwụkwọ Holy Family Spiritual Year Seminary, Okpuno, afọ 2018/19 kwuru na ha bịara mmemme ahụ n’ihi na Fada Ezeani, onye nne ya nwụrụ kụiiri ha ma na-ahụkwa maka ndụ mmụọ ha.
Otu onye na-aga ụka n’Arch-Bishop A.K Obiefuna Retreat, Pastoral and Conference Centre, Okpuno kwuru sị “Fada Ezeani bụ ụkọchukwu na-agbaziri anyị. Ọ bụ ezi onye ọzụzụ atụrụ, ana m ekele Chineke maka ndụ ya. Ya mere, anyị nụrụ ihe merenụ wee sị ka anyị bịa nọnyere ya ma kelekwaa ya maka ọrụ ọma niile Chineke ji ya arụ na Retreat Centre.”
A mụrụ Oriakụ Felicia Ezeani n’ezinaụlọ Cyril Oguadi, nke Ukunu Agulu, e jikọrọ ya na Basil Ezeani nke Umunnonwu dịkwa n’otu Agulu ahụ ọnụ dịka di na nwunye. Chineke ji ọtụtụ ụmụ gọzie ha.
Dịka onye na-ekpere Chineke n’ime mmụọ na eziokwu, o biri ezigbo ndụ kwesịrị ǹǹomị. Ọ gbara afọ iri isii na asaa tupu ọ laa mmụọ.