OGE ụbọchị a kara aka ruru, ndị mmụọ bịara n’ụlọ Ezezemali lụrụ ya laa. Mgbe ha na-ala Ojokoudene sooro ha. Mgbe ha ruru n’ụzọ Ojokoudene kpọrọ Ezezemali gwa ya sị: “Ihe ọ bụla ndị mụọ nyere gị sị gị rie ma ọ bụ sị gị mee, sị ha na ị dịghị eri ya ma ọ bụ na ị dịghị eme ya.”
Ezezemali kwere. Mgbe ha ruru ala ndị mmụọ, ndị mụọ niile pụtara, ma okenye ma nwata na-agba egwu, na-enwe aǹụrị na ekele Ezezemali na-akpọ ya nwunye ha.
Ọtụtụ ndị mmụọ ahụ na-atụ ụjọ n’ile anya nke ukwuu ma Ezezemali kwudosiri ike n’ihi ihe Ojokoudene gwara ya. Mgbe ha buteere Ezezemali nri ka o rie, Ezezemali guba egwu sị:
Mgbe m nọ be nne m faa (ugbo abụọ)
Ijụgo Ojokoudene dịka ana m Erika nrị (ugbo abụọ)
Ojokoudene lesịa nri ahụ jere rie
Ojokoudene nwa ine m.
Ihe ọ bụla ha wetara Ezezemali agụọ egwu ahụ. Ha bute ihe ọǹụǹụ Ezezemali a sị na ya adịghị aǹụ. Ha asị ya bịa rahụ ụra, ọ sị ha na ya adịghị arahụ ụra. Ihe ọ bụla ha gwara Ezezemali ọ sị ha na ya adịghị eri ma ọ bụ na ya adịghị eme ihe ahụ. Mgbe ha jụrụ Ojokoudene, ọ zara ha n’ihe niile o kwuru bụ eziokwu.
Ndị mmụọ wee were iwe sị Ojokoudene ya kpọghachiri Ezezemali nne ya na nna ya n’obodo ha. Mgbe ha batara oke ụzụ tụrụ n’obodo n’ihi na ha che na Ezezemali alaala ala ndị mmụọ nke nlaghachị azụ adịghị.
Otu ahụ ka Ezezemali siri laghachi be nne na nna ya.
Ndị bụ nne na nna zụọnụ ụmụ ụnụ nkeọma ka ha baara onwe ha na unu uru. Ụmụaka kpacharanụ anya ụnụ ma sọpụrụ ndị mụrụ ụnụ.
Chakpii!