Egwu dị ka ozu udele si n’elu na ala daa n’Eke Ihe na steeti Enugu

0
404

NDỊ obodo Ihe nke dị n’okpuru ọchịchị Awgu na steeti Enugu e nwetabeghị onwe ha na nnukwu ihe mgbagwoju anya dapụtara n’Eke, nke bụ ahịa ha na-azụ, na nwa mgbe gara aga.

N’ihe dịka elekere isii nke mgbede ụbọchị Eke ahụ, ka a zụkatara ahịa ozu udele sitere n’elu na-ada n’ahịa ahụ n’ike n’ike. Ụfọdụ ka e kwuru na ha danyechara n’elu gbamgbam ọdụ ahịa.

Ya bụ ihe butere nnukwu katakata n’ihi na o nweghị onye maara ihe kpatara ya. Ka a na-ekwu, ọtụtụ ndị mmadụ bidoro kwube na ndị Fulani na ndị Hausa tinyere nsi n’anụ e gburu ụbọchị ahụ.

Ka ya bụ ihe na-aga n’ihu, ndị mmadụ bidoro tufube anụ ha gotara ụbọchị ahụ. N’ihi na ya bụ ihe mere na mgbede, ndị jirila ya sie nri ghafuru nri ha.

N’ihi ya bụ ebubo e boro ndị Hausa na Fulani na ha tinyere nsi n’anụ nama ha gburu, otu onye Hausa na-egbu anụ n’Eke Ihe aha ya bụ Rabiu bidoro kwuputa ka ihe siri mee site n’itụ otu nwoke na-amụ igbu anụ aka na ọ bụ ya kpatara ihe merenu. Nwoke ahụ na-amụ igbu anu aha ya bụ Ike ka onye dibịa kwụrụ ụgwọ ka ọ wetere ya  ọtụtụ udele nwụrụ anwụ.

N’ihi ya, nwoke ahụ gotara ọtapịapịa wee tinye ya n’anụ ma tụpụrụ ya igwe udele. Ka udele tachara anụ ahụ ha bidoro nwụba n’ike n’ike, ozu ha wee juputa ahịa ahụ niile nke mere ka oke egwu tụọ ndị mmadụ.

Ndị na-ahụ maka ahụike anụmanụ (veterinary officers) si n’isi ọchịchị gọọmenti Awgu wee bịa maka ịchọpụta nke bụ eziokwu na ya bụ ihe.

Ha bukọọrọ ozu udele ndị ahụ lie ma kwụsịkwa ijiji si n’elu na ala wee wụchaa n’Eke ahụ. N’ikpeazụ, ha weere anụ e gburu ụbọchị ahụ laa maka nnyocha.

Rabiu, ya bụ onye Hausa kwuputara nke bụ eziokwu kwuru sị, “Mgbe m hụrụ ihe na-emenụ, agwara m Ike na o kwesịghị ikwe ka onye ezi bịa mebiere anyị ahịa mana ọ sịrị m na ya amaghị na ọ bụ ka ọ ga-esi dapụta.”

A kọkwara na Ike, yaabụ nwoke mere ihe ahụ, kwuru na onye dibịa ahụ kwụrụ ya ezigbo ụgwọ ka o wee gbutere ya ọtụtụ udele.

Ọtụtụ ndị bịara n’ahịa ahụ ịmata ka o si mee. Ha gụnyere onyeisi kansụl Awgu bụ Stanley Okeke na ndị ọchịchị obodo.

Otu o sila dị, ndị uweojii atọhapụla ndị na-egbu anụ ha nwụchikọrọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here