NWA afọ iri a dakporo n’ike na steeti Benue amụọla nwa nwaanyị.
Nwata nwaanyị ahụ aha ya bụ Masenengen enweghịzị nne na nna n’ihi na ha alaala mmụọ. Ọ bụ mgbe o so otu nwanne ha (uncle) wee gbapụ n’obodo ha dị n’okpuru ọchịchị Guma wee gbaga ọsọndụ na Makurdi ka ndị Fulani wakpochara obodo ahụ, ka otu nwoke amaghị onye ọ bụ dakporo ya n’ike wee tụba ya ime.
Ime mere nwata ahụ abali atọ tupu nwanne ha ahụ were kpọga ya ụlọọgwụ General Hospital North Bank, Makurdi. Ọ bụzi ka otu onye o metụrụ n’obi tinyere ihe banyere ya n’ihe ọgbara ọhụrụ ‘social media’, ka Ukan Kurugh bụ onye na-arụ ọrụ ebere ‘humanitarian activist’ na ndị otu ya ndị ọzọ matara maka ya wee kpọga ya na Foundation Hospital Makurdi ebe a nọ waa ya afọ wee kuputa nwa n’udo.
Ka ọ dị ugbu a, ndị mmadụ si n’ugwu na ndịda na-abịa n’ụlọọgwụ ahụ ka ha hu obere nwa ahụ bụzi nne, na nwa ya ọ mụrụ ọhụrụ, ma na-ewetakwa ihe onyinye dị iche iche iji nyere ha aka.
Onye nchịkọba (National Coordinator) Jireh Doo Foundation n’ala anyị bụ Josephine Habba ekwuola na ya agaghị ezu ike ganye na a nwụchịkọọ onye omekome ahụ dakporo nwa ahụ ma kpee ya ikpe.