September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Nwaanyị maara obi di ya

OBI di ya bụ nwaanyị ya na di ya bi na-emekwa ihe na-amasị di ya. Nwaanyị ahụ bụkwazi onye di ya hụrụ n’anya. Ọ bụkwa nwaanyị di ya bu n’obi ma bụrụkwa nwaanyị di ya na-adịghị enwe oke ihe nkọcha na ndụ ya.

Obi di ya bụ nwaanyị di ya hụrụ n’anya, ụdị ịhụnanya nke ndị bekee kpọrọ ‘unconditional love’. Ọ bụkwa ụdị ịhụnanya a dị omimi nke akwụkwọ nsọ kwuru maka ya na nwoke ga-ahụ nwunye ya n’anya. Ọ bụ ụdị ịhụnanya a ka nwoke ji akpọ nwunye ya ‘obi m’.

Ụdị ịhụnanya a na-eme ka nwoke ghara inwe mmasi na-ebe ụmụnwaanyị ndị ọzọ nọ, n’ihi na nke o nwere zuuru ya ma kawaa ụmụnwaanyị ndị ọzọ mma.

Ya mere ndị Igbo ji tụọ ilu sị na asị nna kpọrọ nne na-ememtụta ụmụ ya. Nke a na-egosipụta na ịhụnanya nna hụrụ nne n’aka nke ọzọ na-emetụta ụmụ ya. Nke a na-egosi na ịhụnanya na-esi n’aka fere aka.

Ebe di hụrụ nwunye ya n’anya, ebe ahụkwa ka udo na-adị makana ndị Igbo tụrụ ilu sị na ebe ịhụnanya dị na ebe ahụ ka udo na-adị. Nke a na-egosi na ịhụnanya na-eweta udo ma na-ewetakwa ọganihu. Di ya ji ya eme ọnụ n’ebe ndị ọzọ nọ.

N’aka nke ọzọ, nwaanyị di ya hụrụ n’anya na-eme ihe di ya ji hụ ya n’anya. Ọ bụ nwunye nwere nsọpụrụ n’ebe di ya nọ ya na ebe ụmụnwanne di ya na agbata obi ha nọ. Ọ bụkwa nwaanyị anya ruru ala ma bụrụkwa nwaanyị na-adịghị akpa oke n’ebe ụmụnne ya na ụmụnne di ya nọ. Ọ bụ nwaanyị  anaghị etinye ọgbaaghara ebe mmadụ ibe ya nọ.

Nwaanyị di ya hụrụ n’anya na-abụ onye udo, ọ bụghị onye na-eseta okwu ma ọ bụ onye oke nganga. Ọ bụghị onye na-agba n’ezi, dịka onye na- esoghari ụmụnwoke nke na-abụghị di ya. Ọ bụkwa onye nnagide na onye ndidi, onye na-abụghị onye oke ọchịchọ.

Ọ bụkwa onye nwere aka mgbasapụ n’ebe ndị na-enweghị ka aka ha ha, ọkachasi ndị enwe nne na nna na ndị ajadu. Ọ bụ omume ọma na agwa ọ na-eme ebe di ya nọ nke mere di ya ji hụ ya n’anya ka ndị mmadụ ji asị na nwaanyị ahụ jị ọgwụ jide di ya.

Ihe ọzọ e ji mara nwaanyị maara obi di ya bụ iji ekpere achikọba ezinaụlọ ya nkeọma. Ọ na-enyekwa ntụziaka na ekpere na ije ife Chineke n’ụlọụka.

N’aka nke ọzọ, ndị mmadụ na-ahụta nwaanyị di ya hụrụ n’anya dịka onye ji ọgwụ jide di ya ma na-ahụta nwaanyị ahụ dịka onye ike ozi na ọrụ na-adịghị; ma mgbe ụfọdụ akụkọ ndị a anaghị abụ eziokwu n’ihi na dịka e kwuru na mbụ, agwa bụ mma nwaanyị.

%d bloggers like this: