September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Obianọ anabatala ugwu akwanyere Anambra maka ịkwàlite MSME

Gọvanọ Obiano (n'etiti) na ndị ọzọ na mmemme ahụ.

AKA na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ anabàtala nkwanye ùgwùṅahụ e nyèrè steeti Anambra na nso-nso a dịka steeti kacha akwàdo obere ụlọ ọrụ na azụmahịa ka na-eto eto n’ala Nigeria, a maara na bekee dịka ‘Micro, Small and Medium Scale Enterprises’, bụkwa nke e nyere site n’aka osote onyeisi ala, bụ maazị Yemi Osinbajọ n’aha gọọmenti etiti.

Inyefè ya nkwanye ùgwù ahụ bụ nke e mere na nzukọ isi ọchịchị obodo ahụ nwere nso-nso a n’obi gọọmenti dị n’Awka, ma bụrụkwa nke e mere site n’aka odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelụ.

N’okwu ya oge ọ na-anbata ya bụ nkwanye ùgwù, gọvanọ Obianọ kọwara n’eziokwu na steeti ahụ na-eme nke ọma na ngalaba ahụ, tinyere ngalaba ọrụ ugbo, ngalaba mmepụta ngwọahịa, ngalaba ọrụ na ngalaba ndị ọzọ dị iche-iche.

Ọ gakwazịrị n’ihu kwe nkwa na ọchịchị ya ga-agawanye n’ihu n’ịkwàdò ngalaba ndị ahụ na ụmụafọ steeti ahụ chọrọ ibido obere azụmahịa, ọ kachasị dịka o siri metụta n’inweta ego ha ga-eji mee nke ahụ site n’isi ụlọ akụ ala anyị, bụkwa nke mapụtagòrò ego dị ìjèri Naịra atọ na ụma ise maka ịkwàdo ihe dị otu ahụ.

Na mbụ n’okwu ya Ọkammụta Chukwulobelụ kọwara na ọ bụ mgbata ọsọ gọọmenti steeti ahụ gbatàgòrò na ngalaba ahụ na ihe dị iche-iche o mepụtagoro na ya, ọkachasị site n’ụlọ ọrụ ‘Anambra State Small Business Agency’ (ASBA) mèrè ha jiri nweta ya bụ nkwanye ùgwù, ma kwukwa na osote onyeisi ala bụ Osinbajọ gosiputara ezi njikere ọ dị ịgbatịwanyekwu enyemaka gọọmenti etiti n’ịkwàdo ngalaba ahụ na steeti ahụ.

Ọkammụta Chukuwulobelụ, bụ onye ọ bụ ya jèrè Abụja nata nkwanye ugwu ahụ gara n’ihu kọwaa na steeti ndị a họpụtara maka nkwanye ùgwù ahụ gụnyere steeti Lagos, Kadụna na Abịa, ọbụnadị dịka o mere ka a mara na inwe ohere ịgbaziri ego, inye ọzụzụ na inwe ezi ọnọdụ dị larịị maka ịzụ ahịa n’enweghị ihe nhịa ahụ so n’ihe dị iche-iche e lekwàsịrị anya wee họrọ Anambra dịka ndị tuuru ùgò.

%d bloggers like this: