ONWERE ụdị obi ụmụnwaanyị nwere n’ụdị Chi siri kee ha. Onye ọbụla bụ nne nwere ụdị obi o nwere n’agbanyeghị otu agwa ya siri jọọ njọ. Ụmụnwaanyị ketara iri asatọ (80%) n’ime otu nari n’agwa onye ọbụla na-akpa n’ihi na ọ bụ nwaanyị na-anọ nwata nso oge niile n’izunye nwata ahụ ihe ọ ga-abụ.
Otu onye ọbụla si akpa agwa n’ụwa ka gbado ụkwụ n’ụdị ọzụzụ nne ya zụrụ ya ma ọ bụ ụdị mkpụrụ nne ya kunyere ya n’ime.
Mbili na ọdịda onye ọ bụla dịkarịrị nne ya n’aka n’ihi na ọ bụ ọzụzụ nwaanyị zụrụ nwa ga-ekwu ma ọ bụ ga-egosi ihe nwa ahụ ga-abụ n’ọdịnihu.
Onye ọbụla bụ nwaanyị kwesịrị ịzụ nwa na-ejighị na nke a bụ ọrụ nwoke ma ọ bụ na nke a bụ ozi dịịrị nwaanyị wee zulite ụmụntakịrị. E kwesịrị iji otu ụdị ọzụzụ zụọ ha abụọ ka onye ọ bụla n’ime ha ghara inwe mkpọbi ụkwụ n’ọdịnihu.
Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-eji oke ịhụnanya azụ nwa nke na-ebute mmebi na ndụ nwa ahụ ọkachasi mgbe a tụrụ anya ya nke ukwuu tupu ọ bịa, apabazie ya ka akwa.
Mgbe o toro bụrụ nnukwu mmadụ, ọ kụwaa! Ọ na-akụwa ka akwa mgbe o toro bụrụ nnukwu mmadụ n’ihi na ọ na-esiri ya ike nke ukwuu idozi agwa ya n’ihi ụdị mkpụrụ ọjọọ a kụnyere n’ime ya e kweghị ya edozi na-ebutere ya akpọmasi ebe ọbụla ọ gara.
Onye ọbụla kwesịrị izụsi nwatakịrị ike maka o tolite, onweghịzikwa onye ọ ga-anụ ihe ọ na-ekwu.
N’ihi ya, ọ ka mma ka e were ehihie chụọ ewu ojii n’ihi na agaghị ahụ ya ma ọchịchịị gbaa…
Ka ọ dị izuụka ọzọ.