A rịọla ụmụafọ Anambra ka ha malite ịzụ ehi Igbo

0
353
Okpalaeke

N’IHI na a sị na ọ na-adị mma ji mee ka ọ bụ ya tọkarịrị n’ụtọ, a hapụ ya gbuo ede awaị; a kpọkuola ma dụọ ụmụafọ steeti Anambra na ụmụ Igbo n’izugbe ka ha malite ịzụ ehi Igbo, dịka o so n’otu n’ime ngalaba ọrụ ugbo kwesiri ka e lebàra ya anya nke ọma ugbua ma were ya kpọrọ ihe.

Ọ bụ onyeisi ụlọ ọrụ ‘Eagles Food Processing Industry Nig. Ltd’ bụ Maazị Ugochukwu Okpaleke kpọrọ oku a ma nye ya bụ ndụmọdụ n’ajụjụ ọnụ Ka Ọ Dị Taa gbara ya n’isi ụlọ ọrụ ya dị n’Ụmụchu, n’okpuru ọchịchị Agụata na steeti Anambra, banyere ọgbụgba ahọ iri abụọ na asatọ nke steeti ahụ. Ọ gbara akaebe na ya bụ steeti na-emezị nke ọma na ngalaba ọrụ ugbo karịa n’oge mbụ, ma kwuo na n’agbanyeghị nke ahụ, na ọ ka nwegasịrị ụfọdụ akụkụ ngalaba ahụ kwesiri ka e lebàra ya anya, bụ ngalaba ịzụ ehi Igbo na ihe ugbo ndị ọzọ e nwere ike ịkọ na steeti ahụ, mana a ka na-atụbàta ha na steeti ahụ.

O mere ka a mara na ihe o jiri dị ka ọ bụ ehi Awụsa ka ndị mmadụ na-akacha ego na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị bụ maka na o nwebeghị ọtụtụ ndị Igbo jiri ịzụ ehi Igbo wee kpọrọ ihe, bụkwazị nke mere ndị Awụsa jizị eme ka a ga-asị na ọ bụ naanị ha nà azụ ehi, ma werekwazie ya na-emegasị ọtụtụ ihe dị iche-iche na otu o siri masị ha.

Ya bụ nwa amadi, bụ onye kwuru na o ruola ihe karịrị ahọ iri anọ o jiri bido ịzụ ehi na ịrụ ọrụ ugbo kwùrù na n’oge mbụ, na ọ bụ ndị Igbo na-ebugara ndị Awụsa garrị, mmanụ na ụfọdụ ihe ndị ọzọ dị iche iche a kọpụtara n’ugbo; mana taa, na ọ nọzị ọdụ ka ọ bụ ha na-ebudàtara anyị ihe niile, ọkachasị ihe ndị anyị nwèkwàrà ike ịkọ ma ọ bụ zụọ n’ala Igbo.

N’ihe gbasaara ọnọdụ ọrụ ugbo na steeti ahụ kemgbe e siri kepụta ya, ọ sị na n’oge mbụ, na ọ bụ ọgụ na mmà ka e ji akọ ugbo, ma sịkwa na ọ na-ahịa ndị ọrụ ugbo inweta nkwàdo ma ọ bụ enyemaka gọọmenti, nke mezịrị ka obi jụọ ọtụtụ ndị mmadụ oyi n’ịkọsi ọrụ ugbo ike, tinyekwuoro na ọtụtụ ụzọ adịghị mma ebe ndị ọrụ ugbo si ebupụta ihe ha kọtara n’ugbo ebe ndị na-ego ya ga-enwe ike ịhụ ma gbaa ha aka ahịa. Ihe ndị a, dịka o siri kwuo, bìrì ọrụ ugbo aka ọjọọ n’oge ahụ.

Mana ka ọ dị n’oge ugbua, ọ sị na e nweela ọtụtụ ihe mgbanwè na mnwogharị na ngalaba ọrụ ugbo steeti ahụ dịka o siri metụta otu ọtụtụ Ndị Anambra na ndị oji ego achụ ego si enubàta na ya bụ ngalaba n’ime steeti ahụ ugbua, otu steeti ahụ sizị nwee nri gbaanyụụ ma na-ebupukwa ụfọdụ ihe a kọtara n’ugbo mba ofesi, ya na ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-agba aka ebe banyere agamnihu nke ngalaba ahụ ugbua.

Ya bụ agụnwoke a ma ama n’ịzụ Ehi Igbo gara n’ihu kwuo na ọtụtụ mgbanwe ahụ batágóró na ya bụ ngalaba bụ site na mbọ gọọmenti dị iche-iche chịbụrụ steeti ahụ n’oge mbụ gbàrà, ebe ọtụtụ n’ime ya bụ site n’ọmarịcha atụmatụ ọrụ ugbo bụ ịgba nke aka na-achị steeti ahụ ugbua, bụ Gọvanọ Willie Obianọ webàtàra kemgbe ọ bànyere n’ọkwa n’ahọ 2014, bụ onye o kwuru na ọ bụ n’oge ya ka ọkà n’ọnụ ọgụ ihe ọma niile ahụ malitèrè mebe.

Ka ọ na-ekele ya maka nke ahụ, ọ gazịrị n’ihu kpọkuo ya bụ aka na-achị achị ka ọ gbaa mbọ hụ na e mezùpụtara atụmatụ ahụ e ji n’aka ugbua ịhụ na e nwèrè ebe a ga na-azụ Ehi Igbo n’okpuru ọchịchị iri abụọ na otu e nwèrè na steeti ahụ, bụ ebe o kwuru na a ga-ebido ịzụ, o pekata mpe, ehi otu narị na iri ise na mmàlite; ọbụnadị dịka ọ rịọrọ ya ka a chọọ ihe a ga-eme iji dọta mmasị Ndị Anambra na ndị oji ego achụ ego na n’ịzụ Ehi Igbo na n’ịkọpụta ihe ndị ahụ a na-esi n’ebe ndị ọzọ atụbata na steeti ahụ.

Ọ sị na nke ahụ ga-enye aka mee ka steeti ahụ bụrụ ebe ndị mmadụ ga na-agbata ọsọ igoro ehi, ewu, nri na ihe nri dị iche iche n’ime ahọ ole na ole na-abịa abịa, ma rịọkwazie Ndị Anambra ka ha sonyesie ike na nke ahụ, iji mee ka ya bụ nkịta a na-akpà ghọrọ ngịga.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here