
ỌCHỊCHỊ Gọvanọ Willie Obiano agbaala ọtụtụ mbọ ma na-agbarịrị iji hụ na ndị mmadụ na-aghafu atịtị ebe o kwesiri na steeti ahụ. Ha na-eme nke ahụ iji kwalite ezi ọnọdụ ahụike n’ebe ndị mmadụ nọ.
Onyeisi (Managing Director) Anambra State Waste Management Authority (ASWAMA) bụ Amechi Akorah kwuputara nke a n’ajụjụ ọnụ onye nta akụkọ National Light gbara ya na mkpocha ikpeazu e mere ka ọnwa Ọgọstụ di n’abali iri abuo n’ ano. Ha mere nke ahụ site na njikọ aka nke ‘Africa Clean-Up Initiative’ na Student Union Government (SUG) Nnamdi Azikiwe University Awka.
Dika onyeisi ASWAMA bụ Amechi Akorah siri kwu, a ga na-enwezị mkpocha kwa mgbe kwa mgbe. O kwukwara na ya bụ mkpocha nke ha mere site na ọwa mmirii (culvert) Amansea gbadaa ‘Book Foundation’, Ifite, Awka, bụzị ihe a ga na-eme mgbe ọbụla. O kwukwara na mkpocha ọzọ ha ga-eme ga-abu na ogige Ngozika Estate.
Okwuru sị, “Ana m ekele ndị niile sonyere na mkpocha na nzacha, bụ ndi mere ka ọ gaa nkeọma. Ana m atụ anya ka ndị na-azụ ahia, ndị nwere ihe n’ogbe a, tinyere ndi ọzọ isonye ma ọ bụ na-apụtakwa ụbọchi satọdee ọ bula tupu ọ rue ụbọchi e ji eme nkpocha na nzacha kpomkwem”.
Ọ gara n’ihu kwue na ọ bụrụ na e mechaa mkpocha na nzacha nke monde ọnwa Ọgọstụ ga-adi n’abali iri abuo na isii, na ha ga – eleba anya ihụ na ndị mmadụ na-aghafu atịtị n’ebe o kwesiri. ọ kowari na ha ga-eme nke ahu site na njiko aka nke ndị ọrụ nchekwa,
SUG UNZIK ndị na-azụ ahịa n’oge ahụ, ndi ọkwọ ụgbọala bọọsu, ndi nwegasiri shọọpu, tinyere ndị okpuro ọchịchị Awka South, isonye n’ihụ na ndị mmadụ bi n’akụkụ ebe a dobere ya ọcha site n’iwepụta ndị ga-ahụ n’ndị mmadụ n’ ekechi ahịhịa ọfụma ma na-awufu ya sọsọ ebe kwesiri ekwesi.
N’akụkụ nke ya, onye nlekọta Africa Clean-Up Initiative bụ Funmi Adeniyi kwuru n’obi di ya mma na mkpocha na nzacha ahụ gara ka e si kwado.
Otu nwoke na-edozi isi aha ya bu Kelechi Okafor, onye nke a hụrụ n’ụlọọrụ ya kwuru si, “Aga m ekwuriri na ha rụrụ ọrụ ọma, idebe gburugburu ahụ ọcha, ọ di mkpa mana ana m ekwu na ha kwesirir ịgwa ndị nwere shọọpụ n’ogbe ahụ, ka e mee ya iwu na ha ga na-anoriri ya na mkpocha na nzacha na-abianu…”