IGBO sị na ọ na-abụ uhìe kwobe èkwòbe, ndi ichie atụgharịa ọkpa egwu.
Ka ọ dị taa, gọọmenti okpuru ọchịchị Idemili South nke steeti Anambra ekwuola na a ga-egùzobe ndị nchekwa ọhịa iji nwụchikọọ ndị arụrụ nsị ahụ na-aga mposi aghara aghara n’ebe dị iche-iche ekwesighị n’okpuru ọchịchị ahụ.
Ọ bụ onyeisi nchere oge n’okpuru ọchịchị ahụ, bụ Maazị Dọn Ụnachukwu kwupụtàrà nke a n’Ojoto dị n’okpuru ọchịchị ahụ mgbe ndị nnọchi anya òtù European Union-UNICEF maka ‘Anambra Mission’ gara kpọtụrụ ya n’isi ụlọ ọrụ ya. O mere ka a mara na okpuru ọchịchị ahụ na-enyere ngalaba na-ahụ maka atụmatụ ọrụ adịmọcha ahụ bụ WASH aka n’ụzọ dị iche-iche site n’inye ha ihe ọrụ, ego nkwàdo, ibugharị ha, na n’ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ dị iche iche, iji mee ka ọ na-agawanye n’ihu.
Ọ kwèrè nkwa ilekọta na ileru ha anya otu o kwèsiri, ma kpọkuo ndị eze ọdịnala na ndị isi ọchịchị obodo dị iche-iche n’ime okpuru ọchịchị ahụ, ka ha sonye ma tinye aka n’ịkwalite ọnọdụ adịmọcha n’ime obodo ha, ọ kachasị dịka o siri metụta ịkwụsị kpamkpam ịga mposi aghara aghara na n’ebe ekwesighị ekwesi.
Na mbụ n’okwu ya, onyeisi atụmatụ òtù ọrụ European Union ahụ ma bụrụkwa onye duru ndị ahụ wee bịa njem mkpọtụrụ ahụ, bụ Maazị Kate Kainebi kwùrù na ha na-enye okpuru ọchịchị ahụ nkwàdo n’okpuru atụmatụ adịmọcha WASH ahụ kemgbe ahọ 2006, ma kpọkuo onyeisi ọchịchị ahụ ka ha gaa n’ihu ịkwàdòkwà ya bụ atụmatụ ahụ iji kwàlite ezi ọnọdụ obibi ndụ ụmụ mmadụ.
Ndị òtù ahụ sìkwà ebe ahụ gaa nleta n’Alor ebe ha gbàpùrù mmiri na-eji ike ọkụ anyanwụ were arụ ọrụ, ya na akụrụngwa e ji akwàlite adịmọcha n’ụlọ akwụkwọ Praịma ha, bụkwa ebe onyeisi na ya bụ obodo, bụ Maazị Okey Ọkpala nọrọ wee tòó ha maka ya bụ ọrụ, ma kwe nkwa na ha ga-elekọta ihe ndị ahụ anya nke ọma iji mee ka ha nọtòó aka otu o siri kwesi.