DỊKA ọnwa Ọgọstụ na-abịa na njedebe ka a na-ahụwanye uru na mbọ ụmụnwaanyị na-agba iji hụ na nzukọ ha na-eme na ya na-amịpụta mkpụrụọma.
Ọ bụ na nzukọ ọnwa Ọgọstụ ka ụmụnwaanyị ji atụ alo iji hụ na ihe na-aga nkeọma, ma n’ezinaụlọ, ma n’obodo. Ha na-anọkwa na nzukọ ahụ rụọ ọrụ dị iche iche n’ụlọụka ha dị iche iche. Ọ bụ site na ya bụ nzukọ ka ha ji agba ọnya ego ma werekwa ya mee ọtụtụ ihe bara uru n’obodo. Ụmụnwaanyị na-arụ ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ, ụlọezumezu w.d.g.
N’ebe ụfọdụ ụmụnwaanyị na-esite na nzukọ ọnwa Ọgọstụ mepụta ihe nyiri ụmụnwoke omume. Ima atụ; n’ọtụtụ ụlọụka taa, ụmụnwaanyị rụpụtara agadaga ụlọezumezu ebe ụmụnwoke arụghị ihe ọ bụla. Ha na-ejikọta obi ọnụ na-edozi obodo iji na-enyere ụmụnwoke aka.
Iji mee ka nzukọ ọnwa Ọgọstụ na-amịpụta ihe karịa, nwunye aka na-achị steeti Anambra bụ Dọkịnta Ebelechukwu Obiano (Osodieme) na-agagharị obodo dị iche iche na-enye nkwado ya n’ike n’ike. Ọ na-akụziri ma na-agbazikwara ụmụnwaanyị ụzọ ha ga-esi na-ebi n’ezinaụlọ ha ka udo were chịa. Nke kachanụ bụ na ọ na-agwa ha ka ha ghara ịnọ nkịtị; ka ha chọọ ihe ha ga na-eme iji wee na-enweta ego, ma si n’ụzọ ahụ na-eme ka ibu dịrị di ha mfe.
Oriakụ Obiano na-enyekwa onyinye dị iche iche iji kwado ụmụaka ụwa na-atụ n’ọnụ, tinyere ndị ajadu na ndị onweghị ka ọ ha ha.
Ọ na-ejikwa ohere nzukọ a gazuo steeti Anambra ma leruo anya etu ihe si aga.
N’ime nzukọ ọnwa Ọgọstụ, ụmụnwaanyị na-akwado obodo ha n’ụzọ dị egwu nke na-emekwa ka obodo na-aga n’ihu.