Dịka a na-eme ncheta ọgbụgba afọ iri abụọ na asatọ e ji kee steeti Anambra, ọtụtụ ndị mmadụ ekwuputala ebumnuche ha ma kelekwaa aka na-achị steeti a bụ Gọvanọ Willie Maduaburochukwu Obiano (Akpokuedike). Otu a ka ajụjụ ọnụ onye nta akụkọ anyị CHINWENDU UZOATU gbara ha siri ga:
ORIAKỤ Rose Onwuzulike: Steeti Anambra dị mma. Gọvanọ Obiano na-agbasi mbọ ike iji wee hụ na ihe na-aga otu o kwesịrị. Ọkụ na-enwu ebe niile. Dịka ọ na-agbali maka nchekwa, ana m asị ka o lebakwuo anya n’ebe ndị otu nzuzo nọ, ọ kachasi n’Obosi, ka o tinyekwuo anya n’otu ndị nkuzi gọọmenti si akụziri ụmụakwụkwọ ihe. Nwunye ya bụ Ebelechukwu Obiano na-agbasikwa mbọ ike. Ọ na-eleta ndị onweghị ka ọ ha ha. Ọ na-agwọ ụmụaka nwere ọlụsi.
EBOGHA Peter: Gọvanọ Obiano na-agbali na steeti Anambra. A bịa n’ihe gbasara nchekwa, egwu adịghị. Ma ana m ekwu ka olebakwuo anya na ndị ntorobịa iji gbaziri ha n’ụzọ dị iche iche.
NWAADA Nneka Chuke: Gọvanọ Obiano bụ Akpokuedike n’eziokwu. Steeti Anambra bụzi obodo mmadụ niile na-anọ n’enweghị egwu kpamkpam. N’oge mbụ, mmadụ anaghị agafe n’ụzọ Upper Iweka nke dị n’Onitsha n’abalị, ma kamgbe Obiano banyere n’ọchịchị nke ahụ bụzi akụkọ mgbe ochie. Ọrụ nchekwa na-aga karịa ka a tụrụ anya na steeti anyị n’ebe niile.
IFEANYI Okoli: Ọrụ nchekwa na-aga nkeọma na steeti Anambra. Egwu ọ bụla adịghị. Ọ na-agbalịkwa n’ihe gbasara ọrụugbo. Anyị na-ekwuzi ka o lebakwaa anya na ngalaba ụfọdụ ndị ọzọ dị mkpa.

Oriakụ Eucharia Nwabisi: Gọọmenti steeti Anambra na-agbali ike ya. Obiano na-eke obodo niile ego iji kwado ha maka mmepe obodo. Nwunye ya bụ Ebelechukwu Obiano na-agbalịkwa site n’ịrụ ọrụ ọma dị iche iche, dịka inyere ndị ihe na-esiri ike aka, tinyere ndị ajadu na ndị ọzọ.
Ana m arịọkwa ka gọọmenti lebakwuo anya nkeọma n’ihe gbasara ụkọ ọrụ dị n’obodo, tinyekwara ndị mmadụ a na-achụpụ maka ire ahịa n’okporo ụzọ Eke Awka.

SUNDAY Ekemezie: Ana m ekwu ka a chụpụrụ anyị ndị Fulani, ha na-adakpo ụmụnwaanyị anyị ma na-egbu ndị mmadụ. Ana m akpọkukwa ka gọọmenti rụọ ụzọ sitere ụlọakwụkwọ ‘seminary’ Isuaniocha wee ruo Amanuke.