
N’IHI na ọ na-adị mma ịma ọkwà mmiri tupu ụbọchị ozùzo ya, a kpọkuola ma dụọ ndị bi na mpaghara ogbu mmiri ka ha mụrụ anya ka azụ ma dịkwa njikere maka ịkwagharị ọnọdụ oge adịghị anya, n’ihi ọkwà ahụ a na-ama bànyere iju mmriri nke a na-atụ anya na ọ ga-agba gwòògwò n’ahọ a.
Oku a bụ nke a kpọrọ site n’ọnụ onyeisi òtù ahụ na-ahụ maka ọnọdụ gbanụ-gbanụ na steeti Anambra, — bụ ‘State Emergency Management Agency’ — Maazị Paul Odenigbo na nzukọ inye nkuzi na ịdọ aka na ntị e mere n’okpuru ọchịchị Ayamelụm na Awka North n’otù n’ótù, ma gwa ndị ahụ na ha ga-ama na ya bụ iju mmiri awụchiela ngwangwa ha hụrụ na ogoogo mmiri dị n’obodo ha etobela.
Maazị Obidigbo, nke onye nọchitere anya ya bụ onye enyemaka nye Gọvanọ Willie Obianọ n’ihe gbasaara ụlọ ọrụ SEMA na mgbasa ozi, bụ Maazị Emeka Obinwa chètààrà ndị ahụ na ya bụ ozi abụghị iji wee mapụ ha obi ma ọ bụ mee ka egwù bàá ha ahụ, kama na ebumnobi ya bụ iji wee gbochie ya bụ ajọ ọnọdụ ịdabido ha n’amaghị ama, ma ọ bụ n’akwadoghị akwado.
Ọ kpọpụtasịrị ogige ebe ize ndụ dị iche-iche e weputara maka ichere ya bụ ajọ ọnọdụ n’ime okpuru ọchịchị ahụ, ma dụọ ha ka ha gbaje ọsọ n’ebe ndị ahụ, ọbụnadị dịka o kwèrè ha nkwà na gọọmenti ga elekọta ha anya nke ọma wee ruo n’ogologo oge niile nke iju mmiri ahụ ga-agba.
Na ntụnye nke ya, nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ n’ihe gbasaara ọkụ ọgbụgba na ngwongwo ọhanaeze, bụ Maazị Anthony Achebe mere ka a mara na ọ bụ ụmụaka na ụmụnwaanyị ka ajọ ọnọdụ ahụ na-emetụtakarị, ma kọwazie mkpa ọ dị na ha bùùrù ozi ahụ wee gaa na nzukọ na ọgbakọ dị iche-iche ha nwere n’ime ọnwa Ọgọstụ a.
Eze ọdịnala obodo Amanuke, bụ Igwe Alphonsus Ezebụilo tòrò gọọmenti maka ịchịkọba ya bụ nzukọ na ịma ọkwà ma kwuo na ọ dịkwanụ oke mkpa ka e gbuwàkwuo Ohimiri Niger iji wee bèlata nsogbu iju mmiri ahụ n’ebe ụmụ mmadụ nọ na n’ebe akụnụba ha dị; ebe onyeisi ọchịchị obodo Ụmụmbo dị n’Ayamelụm,
Maazị Anthony Nnama dụrụ ndị na-ahụ maka ime nnyocha na ịma ọkwa ahụ ka ha na-agba mbọ na-ama ya bụ ọkwà n’ime ahọ ole na ole tupu oge ya eruo, ka ndị ọrụ ugbo bi na mpaghara ebe ahụ hapụ ịkọ ọrụ n’ahọ ahụ, ka ha wee kwụsị ịtụfù ọtụtụ ihe ma o ruo, n’ihi na o nweghị ihe dị iti aka n’obi a na-enye ha ruru ka ihe iju mmiri mebìsììri ha n’ugbo.