ONYEISIOCHE Anambra State Community and Social Development Agency (ANCSDA) bụ Chudi Mojekwu wụchara n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation, ndị na-ebipụta akwụkwo akụkọ National Light, SportsLight Xtra na Ka Ọ Dị Taa.
Ọ nọ na njem ahụ wee kọwapụta ebumnobi ACSDA nke bụ maka mmepe ime ime obodo (grassroot development); ma kwukwaa na ọ nọọrọ onwe ya n’ozuzu oke.
N’okwu nnabata ya, onyeisi (Managing Director) nke ANPC bụ Sir Chuka Nnabuife kọwara na ụlọrụ ya bụ ebe ha na-anabata ndị isi na ndị na-akwado obodo, na-eme ka ọ na-aga n’ihu.
Mojekwu kwuru na a malitere ACSDA n’afọ 2009. Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano malitere ọchịchị wee nye ya nkwado dị egwu.
O kwuru na ha na-emepe ime ime obodo, ọ kachasi n’ihe gbasara ndị ogbenye bi na ya. Ha na-akwado ha iji nweta ihe ndị e ji enyere ndụ aka dịka agụmakwụkwọ, mmiri, ahụike, ebe a na-amụ ọrụ aka dị iche iche w.d.g.
Mojekwu kwuru na ha malitere amụma itinye mmiri n’ime ime obodo ka ọnwa Ọgọstụ dị n’abali nke mbụ n’afọ 2018 (afọ gara aga). Na ha lebara anya n’okpuru ọchịchị ndị ụbịam ka njọ na be ha.
Ọ gara n’ihu kwuo na ha na-eme ka obodo ndị ahụ tụnye ụtụ nke ha n’ihe ndị ahụ ha na-arụrụ ha iji mee ka uche ha dị na ya.
O kwukwara sị na tupu ha emee ihe ọ bụla, na obodo ahụ ga-edebanyerịrị aha ha iji wee sonye n’ihe a na-eme;na ndị mmadụ, tinyere gọọmenti na-enyekwa ha nkwado.
Editọ akwụkwọ akụkọ National Light nke ANPC na-ebipụta bụ Rose Oranye jụrụ ya sị “ọrụ ụnụ ọ ga-akwụsị n’ọchịchị Obiano? Olee ihe dị iche n’atụmatụ ụnụ na atụmatụ gọvanọ Obiano bụ ‘obodo ọbụla họrọ ọrụ ọ ga-arụ?’
Mojekwu zara sị, “Ọ bụ ndị omebe iwu hibere ACSDA. Ọ ga na-aga n’ihu makana ụbịam ka dị. Ebe ọ bụ iwu hibere ya, ọ ga na-aga n’ihu.”
Gbasara ajụjụ nke abụọ, ọ zara sị, “A bịa na ACSDA, obodo na-atụnye ụtụ n’ọrụ a na-arụrụ ha iji nwe ikike na ya (ownership). Ọchịchị ime obodo (LG) na-enye obodo nkwado.
Ndị obodo na-eji ya akpọrọ ihe n’ihi ụtụ ha tụnyere na ya karịa nke ha nwetara n’efu.”
Ọ zara ọtụtụ ajụjụ ndị ọzọ a jụrụ ya nke gụnyere ihe iche aka mgba ha na-enweta n’ọrụ. Ọ zara sị; “I nweta ndị obodo a ga-arụrụ ọrụ adịghị mfe. Oge ụfọdụ anyị na-eme njem n’elu mmiri.”
Mojekwu gara n’ihu kwuo na ha arụọla ụlọ obibi ndị nkuzi n’ọtụtụ ụlọakwụkwọ dị n’ime ime obodo nke bụ na onye nkuzi ọ bụla hụrụ ya ga-enwe mmasị ibi na ya.
Nnamdi Onuzulike bụ onye na-ahụ maka mgbasaozi, agụmakwụkwọ, mmekọrịta ndị obodo na ọzụzụ na ACSDA so Mojekwu wee bịa njem ahụ na ANPC.