OTU ajọ onye ntọrị n’ụzọ awaraawara si Abuja gaa Kaduna, Bello Audu, asaala asịsa na o gbuola ihe dịka mmadụ iri kemgbe o bidoro ịtọ mmadụ n’afọ gara aga.
Nwa amadi ahụ bụ Audu dị afọ iri anọ na abụọ sara ya bụ asịsa mgbe ndị ọru ‘Intelligence Response Team’ (IRT) gbara ya ajụjụ. O kwukwara na ya na ndị ọjọọ ndị ọzọ ezurula ehi dị ihe dịka narị abụọ n’ọgụgụ n’obodo dị iche iche ka mgbe o si Kajuru, obodo a ma ama na steeti Kaduna wee bịa steeti Niger.
N’ihe onyoonyoo e wepụtara na ‘PR Nigeria’, Audu onye ntọrị ahụ na-egbu mmadụ ma na- ezu ohi ehi sịrị na ya na ndị dị ka ya ndị ọzọ esonyela na njem ịtọrị mmmadụ ihe dịka ugboro iri ise, ebe ha ji egbe ‘AK-47riffle, ” tinyere ọtụtụ ngwa agha ndị ọzọ.
N’okwu ya ọzọ, Audu sịrị na ya anarala mmadụ isii ya tọrọgoro nde nari naịra isii n’ofu n’ofu.O kwuru sị; ”O nwere mgbe anyị naara nde narị iri, nde narị iri na isii, nde narị iri na asaa, nde narị iri abụọ na ọtụtụ ego ndị ọzọ n’aka ndị anyị jidere”
Audu bụ nwoke nwere nwunye abụọ na ụmụaka ise. ọ sịrị na ya na-egbufu ụfọdụ ndị ya tọọrọ ma ọ bụrụ na ndị nwe onye ahụ jụ ịkwụ ego ahụ ọsọ ọsọ, ime ka ya siri chọọ.
O mere ka a mara na ha nwere ụfọdụ ebe nzuzo dị iche iche na Rijana n’ ụzọ awaraawara Abuja-Kaduna.O gosiri obi nwute otu o si were ịtọ mmadụ mere ihe o ji ebi ndụ, ma kwe nkwa na ya ga- ewepụtasị ngwa agha ntọrị nille ma nyere ndị uweojii aka ịnwụchikọ ndị ntọrị niile nọ na steeti abụọ ahụ ha na- akpa arụ.